Mmadụ Niile Hà Nwere Ohere Ha Nhata Ịmata Chineke?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Mmadụ Niile Hà Nwere Ohere Ha Nhata Ịmata Chineke?
▪ Mgbe a jụrụ Jizọs iwu kasị ukwuu, o kwuru, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ma, tupu ndị mmadụ enwee ike ịhụ Chineke n’anya, ọ dị ha mkpa inweta ezi ihe ọmụma banyere ya. (Jọn 17:3) Mmadụ niile hà ga-enwe ohere ha nhata inweta ihe ọmụma a?
Ebe bụ́ isi e si amata banyere Chineke bụ Baịbụl. (2 Timoti 3:16) Ọtụtụ ndị bi n’ebe ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe inweta Baịbụl. O nwekwara ike ịbụ na a na-agba otu ndị ahụ ume mgbe mgbe inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke site n’ịmụ Baịbụl n’onwe ha. (Matiu 28:19) Ọ bụ nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-enye ha ohere ịmụ banyere Chineke kwa ụbọchị, mụrụ ụfọdụ n’ime ha.—Diuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 6:4.
Ma, o nwere ike ghara ịdịrị ndị ọzọ mfe otú ahụ ịmụ banyere Chineke. Ụfọdụ ndị si n’ezinụlọ ebe a na-eme ihe ike bụ́ ebe nne na nna na-anaghị egositụ ụmụ ha ịhụnanya. (2 Timoti 3:1-5) O nwere ike isiri ndị a zụlitere n’ezinụlọ dị otú ahụ ike ile Chineke anya dị ka Nna ha nke eluigwe hụrụ ha n’anya. Ọtụtụ agụchaghị akwụkwọ, bụ́ nke na-eme ka ịgụ Baịbụl na-esiri ha ike. E jirikwala ozizi ụgha nke okpukpe mee ka ndị ọzọ kpuo ìsì, ma ọ bụ ya abụrụ na ha bi n’ezinụlọ, ógbè, ma ọ bụ ná mba ebe a na-anaghị enye ndị mmadụ ohere ịkụzi eziokwu Baịbụl. (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Ọnọdụ nke ndị dị otú ahụ ò nwere ike ime ka ha ghara inwe ohere ịmụta banyere Chineke na ịhụ ya n’anya?
Jizọs kwuru ihe gosiri na nsogbu ndị nwere ike ịbịara ụfọdụ ndị nwere ike ime ka o siere ha ike ịhụ Chineke n’anya na irubere ya isi. (Matiu 19:23, 24) Ma, Jizọs chetaara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụ ezie na ihe mgbochi ụfọdụ nwere ike iyi ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emerili, “n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:25, 26.
Tụlee ihe ndị na-esonụ: Jehova Chineke hụrụ na Okwu ya, bụ́ Baịbụl, bụ akwụkwọ a kacha kesaa n’ụwa. Baịbụl buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma banyere Chineke na nzube ya maka ụwa “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Taa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ ma na-ebipụta akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ihe dị ka narị asụsụ ise. Ndị na-enweghị ike inweta Baịbụl ka nwedịrị ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere ezi Chineke site n’ikiri ihe ndị o kere.—Ndị Rom 1:20.
Ọzọ, Okwu Chineke kwuru, sị: “Jehova na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche. Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) N’ihi ya, ọ bụ ezie na Jehova ekweghị nkwa na mmadụ niile ga-enwe ohere ha nhata, ọ na-ahụ na e nyere ndị niile nwere obi eziokwu ohere ịmụta banyere ya. Ọ ga-ahụdị na ndị na-enwetụghị ohere ịmụ banyere ya nwetara ohere dị otú ahụ site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ ezi omume.—Ọrụ 24:15.