Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

7 Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ya Ma Zaa Ya?

7 Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ya Ma Zaa Ya?

Ekpere

7 Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ya Ma Zaa Ya?

AJỤJỤ ahụ dị n’elu na-akpali nnọọ mmasị ndị mmadụ, na-emekwa ka ha chee echiche. Baịbụl gosiri na Jehova na-anụ ekpere taa. Ma ọ̀ ga-anụ nke anyị ma ọ bụ na ọ gaghị anụ kacha dịrị anyị n’aka.

Jizọs katọrọ ndị ndú okpukpe nke oge ya, bụ́ ndị na-ekpe ekpere ihu abụọ; mkpa ha bụ naanị ime nsọ nsọ n’ihu ọha. O kwuru na ndị dị otú ahụ ‘ga-enwetazu ụgwọ ọrụ ha,’ nke pụtara na ha ga-enweta naanị ihe ha kacha achọ, bụ́ ndị mmadụ ịhụ ha, ma ha agaghị enweta ihe dị ha mkpa, bụ́ Chineke ige ha ntị. (Matiu 6:5) Taakwa, ọtụtụ na-ekpe ekpere kwekọrọ n’uche ha, ọ bụghị nke kwekọrọ n’uche Chineke. Ebe ọ bụ na ha na-eleghara ụkpụrụ Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha anya, Chineke anaghị ege ha ntị.

Oleekwanụ banyere gị? Chineke ọ̀ ga-anụ ma zaa ekpere gị? Azịza ya adabereghị n’agbụrụ, mba ma ọ bụ ọkwá gị. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ị̀ bụ ụdị onye ebe a na-ekwu banyere ya? Ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Chineke, ị ga-eji Chineke kpọrọ nnọọ ihe, na-atụ egwu imejọ ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ezi omume, ị ga-achọ ime ihe Chineke sịrị na o ziri ezi, kama ime uche gị ma ọ bụ uche ụmụ mmadụ ibe gị. Ị̀ chọrọ n’ezie ka Chineke na-ege ntị n’ekpere gị? Baịbụl gosiri gị otú i nwere ike isi kpee ekpere Chineke anụ. *

N’ezie, ọtụtụ ndị na-achọ ka Chineke jiri ọrụ ebube zaa ekpere ha. Ma, ọbụna n’oge Baịbụl, Chineke arụghị ụdị ọrụ ebube ahụ mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ narị afọ gafere n’agbata mgbe Chineke rụrụ otu ọrụ ebube a kọrọ na Baịbụl na mgbe ọ rụrụ ọzọ. Ọzọkwa, Baịbụl gosiri na oge ọrụ ebube gwụrụ mgbe ndịozi nwụchara. (1 Ndị Kọrịnt 13:8-10) Nke a ọ̀ pụtaziri na Chineke anaghị aza ekpere taa? N’ezie, ọ na-aza! Tụlee ụfọdụ ekpere ndị ọ na-aza.

Chineke na-enye amamihe. Jehova bụ Isi Iyi nke ezi amamihe niile. Ọ na-eji mmesapụ aka enye ya, na-enye ya ndị chọrọ nduzi ya na ndị chọrọ iji ya na-eduzi ndụ ha n’efu.—Jems 1:5.

Chineke na-enye mmụọ nsọ ya na uru niile ọ na-aba. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ. Ọ dịghị ike ka ya. O nwere ike inyere anyị aka idi ọnwụnwa. O nwere ike ime ka anyị nwee nnọọ udo nke obi mgbe ihe na-echegbu anyị. O nwere ike inyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha ga-eme ka ndị mmadụ na-akpa anyị nso. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Chineke na-enye onyinye a n’ụba.—Luk 11:13.

Chineke na-enye ndị na-achọsi ya ike ihe ọmụma. (Ọrụ 17:26, 27) Gburugburu ụwa, e nwere ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu. Ha chọrọ ịmata banyere Chineke—ihe aha ya bụ, nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ, na otú ha nwere ike isi bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Ndịàmà Jehova na-ahụkarị ndị dị otú ahụ, ọ na-atọkwa ha ụtọ ịkọrọ ha otú Baịbụl si zaa ụdị ajụjụ ndị ahụ.

Ọ̀ bụ ihe mere i ji nweta magazin a? Ị̀ na-achọ Chineke? Ikekwe, ọ bụ otú a ka o si na-aza ekpere gị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú i nwere ike isi kpee ekpere Chineke anụ, gụọ isi 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.