Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alaeze nke Ga-agbanwe Ụwa Niile

Alaeze nke Ga-agbanwe Ụwa Niile

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Alaeze nke Ga-agbanwe Ụwa Niile

Ì NWERE ike ịkọ̀ Alaeze a na-ekwu?— * Ọ bụ nke ahụ Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya. Ọ kụziiri anyị ịrịọ Chineke, sị: “Ka Alaeze gị bịa.” (Matiu 6:9, 10) Kemgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ, ndị na-eso ụzọ Jizọs ekpegarala Chineke ekpere ka Alaeze Ya bịa. Ì kpeela ekpere banyere ya?—

Iji ghọta ihe alaeze bụ, ọ dị gị mkpa ịghọta ihe eze bụ. Eze bụ onye na-achị achị. A na-akpọ ebe ọ na-achị ala ya. Ebe Alaeze Chineke ga-achị gụnyere ụwa niile. Mgbe Alaeze Chineke bịara, onye ọ bụla nọ n’ụwa n’oge ahụ ga-enweta ngọzi ndị ọchịchị ya ga-ewetara ụmụ mmadụ.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe. N’Aịzaya 9:6, Baịbụl gwara anyị banyere onye ga-abụ Onyeisi ọchịchị ahụ. Lekwa ihe o kwuru banyere ya: “A mụworo anyị otu nwa, . . . ịchịisi ga-adị n’ubu ya. A ga-akpọ ya . . . Onyeisi Udo.”

Ònye bụ Eze kasịnụ n’eluigwe?— Ị zatara ya ma ị sị na ọ bụ Jehova. Baịbụl kpọrọ ya “Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) Na Baịbụl, a na-akpọkarị Jizọs “Ọkpara Chineke.” Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụ Jehova nyere Jizọs ndụ. Ọ bụ Jehova bụ ezi Nna Jizọs.—Luk 1:34, 35; Jọn 1:34, 49; 3:17; 11:27; 20:31; Ọrụ 9:20.

Alaeze Chineke ahụ, nke Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya, bụ ọchịchị pụrụ iche. Jehova mere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, Onye Ọchịchị, ma ọ bụ Eze, nke Alaeze ahụ. Ma ị̀ maara na a ga-ahọrọ ndị ọzọ iso Jizọs chịa dị ka ndị eze n’Alaeze Nna ya?— Ka anyị kwuo banyere ha.

Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ya na-aga “n’ụlọ” Nna ya n’eluigwe. O kwuru, sị: “M na-aga ịkwadebere unu ebe . . . ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.” (Jọn 14:1-3) Ị̀ maara ihe ndịozi ahụ na ndị ọzọ a họọrọ ga-eso Jizọs rụọ n’eluigwe?— Ha “ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze.” Baịbụl kwudịrị mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa dị ka ndị eze. Ha ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.—Mkpughe 14:1, 3; 20:6.

Olee otú i chere ụwa ga-adị mgbe Onyeisi Udo ahụ na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ọ họọrọ ga-amalite ịchị?— Ọ ga-amagbu onwe ya! Agha agaghị adịkwa. Ụmụ anụmanụ na ibe ha ga-adị n’udo, anyị na ha ga-ebikwa n’udo. O nweghị onye ga-arịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ. Anya ndị ìsì ga-ahụ ụzọ, ntị ndị ntị chiri ga-anụ ihe, ndị ngwọrọ ga-agba ọsọ, na-awụlikwa elu dị ka mgbada. Ala ga-emepụta ezigbo nri ga-ezuru onye ọ bụla. Mmadụ niile ga-ahụkwa ibe ha n’anya dị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ime. (Jọn 13:34, 35) Ka anyị sapee amaokwu ndị a si n’akwụkwọ Aịzaya e depụtara ebe a ma gụọ banyere ihe ndị magburu onwe ha ga-eme mgbe ahụ.—Aịzaya 2:4; 11:6-11; 25:8; 33:24; 35:5, 6; 65:21-24.

Kemgbe Jizọs kụziiri ndị mmadụ ikpe ekpere “ka alaeze gị bịa,” ọtụtụ nde mmadụ amụtala banyere Alaeze ahụ. Ihe a ha mụtara agbanweela ndụ ha. N’oge na-adịghị anya, mgbe Alaeze ahụ ga-abịa nọchie ọchịchị niile dị n’ụwa, onye ọ bụla na-ejere Jehova Chineke na Onye Ọchịchị ya ọ họọrọ, bụ́ Jizọs Kraịst, ozi ga-enwe udo, ahụ́ ike, na obi ụtọ.—Jọn 17:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

AJỤJỤ:

▪ Ònye bụ onye ọchịchị nke Alaeze Chineke?

▪ Olee ndị ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze Nna ya?

▪ Olee otú ụwa ga-adị mgbe Jizọs ga-achịwa?