Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ọrụ Ndị Mmụọ Ozi Si Emetụta Ndụ Anyị

Otú Ọrụ Ndị Mmụọ Ozi Si Emetụta Ndụ Anyị

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Otú Ọrụ Ndị Mmụọ Ozi Si Emetụta Ndụ Anyị

Jizọs na Nna ya biri n’eluigwe “mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:5) N’ihi ya, ọ ga-ama nnọọ azịza ajụjụ ndị na-esonụ.

Ndị mmụọ ozi hà nwere mmasị n’ebe anyị nọ?

▪ Jizọs mere ka anyị mata na ndị mmụọ ozi nwere nnọọ mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ. O kwuru, sị: “Ndị mmụọ ozi Chineke ga-enwe ọṅụ n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ.”—Luk 15:10.

Jizọs gosiri na e nyere ndị mmụọ ozi ọrụ inyere ndị ohu Chineke aka ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma. N’ihi ya, mgbe Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ, o kwuru, sị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.” (Matiu 18:10) Ihe Jizọs na-ekwu ebe a abụchaghị na onye nke ọ bụla na-eso ụzọ ya nwere otu mmụọ ozi e nyere ọrụ iche ya nche. Ma, Jizọs gosiri na ndị mmụọ ozi ha na Chineke na-arụkọ nnọọ ọrụ nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nọ.

Olee otú Ekwensu nwere ike isi megharịa anyị anya?

▪ Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na Setan na-anwa ime ka ndị mmadụ ghara ịmata eziokwu banyere Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu banyere alaeze ahụ ma ọ ghọtaghị ihe ọ pụtara, ajọ onye ahụ na-abịa pụnara ya ihe a ghara n’obi ya.”—Matiu 13:19.

Jizọs gbara otu ụzọ Setan si eduhie ndị mmadụ n’anwụ mgbe ọ tụrụ otu ilu banyere otu nwoke nke ghara ọka wit n’ubi ya. Nwoke ahụ nọchiri anya Jizọs, ọka wit ahụ nọchikwara anya ezi Ndị Kraịst ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. Ma, Jizọs kwuru na otu onye iro bịara “kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ.” Ata ahụ nọchiri anya Ndị Kraịst ụgha. “Onye iro nke kụrụ ha bụ Ekwensu.” (Matiu 13:25, 39) Dị nnọọ ka ata na-eyi ọka wit mgbe o pulitere, ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst nwere ike iyi ndị na-efe Chineke ezi ofufe. Okpukpe ndị na-ezi ozizi ụgha na-eduhie ndị mmadụ inupụrụ Chineke isi. Setan na-eji okpukpe ụgha eme ka ndị mmadụ ghara ịbụ ndị enyi Jehova.

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Setan ghara inweta anyị?

▪ Jizọs kpọrọ Setan “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) N’ekpere Jizọs kpegaara Chineke, o mere ka anyị mara ihe nwere ike ichebe anyị ka Setan ghara inweta anyị. Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa. Jiri eziokwu doo ha nsọ; okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:15-17) Ịma Okwu Chineke nwere ike ichebe anyị ka ụwa Setan na-achị ghara imerụ anyị.

Olee otú ọrụ ndị mmụọ ozi si emetụta ndụ anyị taa?

▪ Jizọs kwuru, sị: “N’ọgwụgwụ nke usoro ihe a: ndị mmụọ ozi ga-aga kewapụ ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume.” (Matiu 13:49) Anyị bi ugbu a ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a,’ ọtụtụ nde mmadụ na-anabatakwa ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:3, 14.

Ma, ọ bụghị mmadụ niile malitere ịmụ Okwu Chineke ka ihe ha na-amasị Chineke. Ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ ndị ohu Jehova, ha na-ekewapụtakwa ndị ji obi ha niile hụ Chineke n’anya site ná ndị na-achọghị ime ihe ha na-amụta eme. Mgbe Jizọs na-akọwa ndị ihe ha na-amasị Chineke, o kwuru, sị: “Ma ndị ahụ dara n’ala dị mma bụ ndị na-ejigide okwu ahụ mgbe ha ji ezi obi nke dị mma nụ ya wee jiri ntachi obi na-amị mkpụrụ.”—Luk 8:15.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi nke 10 nke akwụkwọ a Gịnị n’Ezie ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị mmụọ ozi so enyere ndị nwere ezi obi aka ịbata n’ọgbakọ Ndị Kraịst