Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-echebara Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Naanị Ha Na-azụ Ụmụ Echiche

Na-echebara Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Naanị Ha Na-azụ Ụmụ Echiche

Na-echebara Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Naanị Ha Na-azụ Ụmụ Echiche

NDỊ nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ so ná ndị kacha adọgbu onwe ha n’ọrụ n’igbo mkpa ezinụlọ ha. Ihe ndị na-eche ha aka mgba karịrị akarị. Ha na-arụ ọtụtụ ọrụ iji nwee ike ịzụlite ụmụ ha. E wezụga ọrụ ego ha na-arụ, ha na-aga ahịa azụta ihe, na-esi nri, na-edebe ụlọ ọcha, na-azụkwa ụmụ ha. Ọ bụkwa ha ka ọ dịịrị ịhụ na ahụ́ siri ụmụ ha ike, ime ka ha na-atụrụ ndụ, ime ka obi na-eru ha ala, nakwa iwepụta oge dị mkpa ha ga-eji na-anọ naanị ha, ma o kwe mee.

Ọ bụ ezie na ezinụlọ ebe naanị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ na-amụba n’ike n’ike n’ebe niile taa, ọ dị mfe ileghara ha anya. Otu nwaanyị kwetara, sị, “Anaghị m echebachara ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ echiche ruo mgbe m ghọrọ otu n’ime ha.” Olee ihe i nwere ike ime iji gosi na ị na-echebara ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ echiche? Ihe banyere ha ò kwesịrị imetụ gị n’obi? Ka anyị tụlee ihe atọ mere anyị ji kwesị ilebara ha anya.

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Chebara Ha Echiche

Ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ chọrọ enyemaka. Otu nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye dị afọ iri anọ na otu, nke na-azụ ụmụ abụọ, kwuru, sị, “E nwere mgbe m na-amaghị ihe m ga-eme eme, ọ na-adịkwa m ka ọtụtụ ibu m bu hà karịrị m akarị.” Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye, di ma ọ bụ nwunye mmadụ ịhapụ ya, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ emeela ka obi dị ọtụtụ ndị naanị ha na-azụ ụmụ otú ọ dị otu nwaanyị. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Anyị na-arịọ ka a gbatara anyị ọsọ enyemaka, ọ dịkwa anyị oké mkpa!”

Ọ ga-eme ka i nwee obi ụtọ. Ò nwetụla mgbe i butụụrụ mmadụ ibu na-anyịgbu ya? Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na obi tọrọ gị ụtọ na i mere ihe a na-ahụ anya iji nyere ya aka. N’otu aka ahụ, mgbe ụfọdụ, ndị naanị ha na-azụ ụmụ na-ebu ibu karịrị ihe otu onye ga-ebuli. Ọ bụrụ na i nyere ha aka gboo mkpa ha, ị ga-ahụ na ihe e kwuru n’Abụ Ọma 41:1 bụ eziokwu, bụ́ ebe kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe.”

Ọ na-eme Chineke obi ụtọ. Jems 1:27 kwuru, sị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.” Ilekọta ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ sokwa na ya. * Ndị Hibru 13:16 kwuru, sị: “Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”

Ugbu a anyị tụlechara ihe atọ ndị mere anyị ji kwesị ichebara ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ echiche, ka anyị lebazie anya n’ihe i nwere ike ime iji nyere ha aka na otú i nwere ike isi jide n’aka na aka i nyeere ha ga-abara ha uru.

Ịghọta Mkpa Ha

I nwere ike iche na ihe i kwesịrị ime bụ ịjụ onye naanị ya na-azụ ụmụ, sị, “Olee ihe m ga-emere gị?” Ma n’eziokwu, nke a anaghị emecha ka mmadụ gwa gị ihe dị ya nnọọ mkpa. Dị ka anyị kwuburu, ihe Abụ Ọma 41:1 kwuru bụ ‘iji nghọta na-emeso’ onye dị otú ahụ ihe. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kọwara na okwu Hibru e dere ebe ahụ nwere ike ịpụta “ichebara ihe tara akpụ echiche ma kpebie iji amamihe meso mmadụ ihe.”

N’ihi ya, ị chọọ ịmata ụzọ kacha mma ị ga-esi nyere onye naanị ya na-azụ ụmụ aka, ọ dị mkpa ka i chebara ihe ndị na-eche ya aka mgba ezigbo echiche. Anya ruo gị ala, elekwala ọnọdụ ya anya elu elu. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ya bụrụ m, olee ihe m ga-achọ ka ndị mmadụ meere m?’ Ma, ọtụtụ ndị naanị ha na-azụ ụmụ ga-agwa gị na n’agbanyeghị mbọ niile i nwere ike ịgba, i nweghị ike ịghọtacha ihe ndị naanị ha na-azụ ụmụ na-ahụ, ọ gwụla ma ị̀ ghọrọ otu n’ime ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ime ihe niile i nwere ike ime iji gosi na ọnọdụ ha na-emetụ gị n’obi ga-eme ka ‘i jiri nghọta na-emeso’ ndị naanị ha na-azụ ụmụ ihe.

Ṅomie Ihe Nlereanya Zuru Okè nke Chineke

A bịa n’ilebara ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ anya, o nweghị onye jirila ịhụnanya gbooro ha mkpa ha karịa Jehova Chineke. Ọtụtụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ na-egosi otú Jehova Chineke si echebara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, nke pụtakwara ndị naanị ha na-azụ ụmụ, na ụmụ na-enweghị nna, echiche. Inyocha otú Chineke si egboro ndị ahụ ọ na-enweghị ka ọ hà ha mkpa ha nwere ike ime ka anyị mụta otú anyị ga-esi nyere ha aka, ya abara ha ezigbo uru. E nwere ihe anọ dị mkpa anyị ga-atụle.

Gee ha ntị

N’Iwu Jehova nyere Izrel oge ochie, o kwuru na ya ‘aghaghị ịnụ mkpu ákwá’ nke ndị nọ ná mkpa. (Ọpụpụ 22:22, 23) Olee otú i nwere ike isi ṅomie ezi ihe nlereanya a? Ezigbo owu na-amakarị ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ, ebe ha na-enweghị ndị toro eto ha na ha na-ekwurịta okwu. Otu nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ kwara arịrị, sị, “Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ ụmụaka m laba, mụ ebegide ákwá ike agwụ m. Owu ọmụma anaghị ekwe m odidi mgbe ụfọdụ.” Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ọ́ gaghị adị mma ka ị gakwuru onye naanị ya na-azụ ụmụ iji ‘nụrụ mkpu akwa’ ya, bụ́ onye nwere ike ịchọ onye ọ ga-akọrọ otú obi dị ya? Ige onye naanị ya na-azụ ụmụ ntị n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị nwere nnọọ ike inyere ya aka idi nsogbu ya.

Gbaa ha ume

Jehova mere ka e jiri ike mmụọ nsọ ya dee abụ ndị dị nsọ, ma ọ bụ abụ ọma, bụ́ ndị ụmụ Izrel ga na-agụ mgbe ha na-efe ofufe. Chegodị echiche agbamume ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ụmụ na-enweghị nna bụ́ ndị Izrel ga na-enweta mgbe ha na-abụ abụ ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee bụ́ ndị chetaara ha na Jehova bụụrụ ha “nna” na “onyeikpe,” nakwa na ọ ga-enyere ha aka. (Abụ Ọma 68:5; 146:9) Anyị nwekwara ike ịgwa nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ okwu ga-agba ya ume bụ́ nke ọ na-agaghị echefu ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ezie na afọ iri abụọ agafeela kemgbe otu nna zụtoro ụmụ gwara Ruth, bụ́ nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ, sị: “Ị na-agbalị n’otú i si na-azụ ụmụ gị nwoke abụọ. Jide nke i ji,” Ruth ka na-echeta ya. Ruth kọrọ, sị: “Okwu ndị ahụ ọ gwara m metụrụ m nnọọ n’ahụ́.” N’ezie, “okwu ọma bụ ezigbo ọgwụ,” o nwekwara ike ịgba nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ ume karịa otú anyị nwere ike iche. (Ilu 15:4, Contemporary English Version) Ì nwere ike iche echiche banyere otu ihe nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ na-eme nke ị ga-aja ya mma maka ya?

Gbooro ha mkpa anụ ahụ́ ha mgbe ọ dị mkpa

N’Iwu Jehova nyere ndị Izrel oge ochie, o mere ndokwa ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ụmụ na-enweghị nna nweta nri ga-ezuru ha ma ka nwee ùgwù ha. N’ihi ndokwa ndị ahụ, ndị a na-enweghị ka ọ hà ha na-enwe ihe ga-ezuru ha ndị ha ‘ga-eri wee rijuo afọ.’ (Diuterọnọmi 24:19-21; 26:12, 13) Anyị nwekwara ike iji akọ nye onye naanị ya na-azụ ụmụ nke nọ ná mkpa ihe otú ha ka ga-enwekwa ùgwù ha. Ì nwere ike idewere ha ihe oriri n’ụlọ ha ma ọ bụ zụtara ha ihe n’ahịa? Ì nwere uwe nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ ma ọ bụ ụmụ ya nwere ike iyi? Ka ì nwere ike inye onye naanị ya na-azụ ụmụ ego o nwere ike iji zụta ihe ụfọdụ dị ezinụlọ ya mkpa?

Na-akpakwuru ha

Jehova nyere iwu ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ụmụ na-enweghị nna soro n’ememme ndị Izrel na-eme kwa afọ, bụ́ ebe ha na ndị Izrel ibe ha ga-enwe ike ịkpakọrịta. N’ezie, a gwara ha, sị: “Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.” (Diuterọnọmi 16:10-15) N’otu aka ahụ taa, a dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘na-ele ibe ha ọbịa,’ bụ́ nke ga-eme ka ha nwee oge ha na ibe ha ga-eji ọṅụ nọrịa. (1 Pita 4:9) Ya mere, ọ́ gaghị adị mma ka ị kpọọ onye naanị ya na-azụ ụmụ na ezinụlọ ya ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị? Ọ pụtaghị na ị ga-esi nri buru ibu. Jizọs sịrị na “ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole ma ọ bụ naanị otu ihe” mgbe ọ gara n’ụlọ ndị enyi ya ka ya na ha nọrịa.—Luk 10:42.

Ha Ga-enwe Obi Ụtọ Maka Enyemaka Gị

Kathleen, bụ́ nwaanyị naanị ya zụlitere ụmụ atọ, kwuru na ọ dịghị mgbe ya ga-echefu ezigbo ndụmọdụ bụ́, “Atụla anya ihe ọ bụla; kelee onye ọ bụla nyere gị ihe.” Dị ka ọ dị Kathleen, ọtụtụ ndị naanị ha na-azụ ụmụ ghọtara na ọ bụ ọrụ dịịrị ha ịzụlite ụmụ ha. N’ihi ya, ha anaghị atụ anya ka ndị ọzọ meere ha ihe ha kwesịrị imere onwe ha. Ka o sina dị, o doro anya na obi na-adị ha ụtọ maka aka ọ bụla e nyeere ha. I nwere ike ime ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ obi ụtọ, meekwa onwe gị obi ụtọ site n’ichebara ha echiche, nwee obi ike na Jehova Chineke “ga-akwụ gị ụgwọ maka ihe i mere.”—Ilu 19:17, New Century Version.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụ ezie na okwu bụ́ “nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ” adịghị na Baịbụl, okwu bụ́ “nwaanyị di ya nwụrụ” na “nwa na-enweghị nna” pụtara ugboro ugboro. Nke a na-egosi na e nwere ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna naanị ha na-azụ ụmụ n’oge Baịbụl.—Aịzaya 1:17.

[Foto dị na peeji nke 24]

Olee mgbe ikpeazụ ị kpọrọ onye naanị ya na-azụ ụmụ na ezinụlọ ya ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị? Ọ́ gaghị adị mma ka i mee nke a n’oge na-adịghị anya?