Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?

Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị iji nweta azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Olee ihe mere anyị ga-eji mụta ihe n’aka Chineke?

Chineke nwere ozi ọma nke ihe ka mma maka ụmụ mmadụ. Ọ gwara anyị banyere ya na Baịbụl. Baịbụl dị ka akwụkwọ ozi nke Nna anyị nke bi n’eluigwe onye hụrụ anyị n’anya detaara anyị.—Gụọ Jeremaya 29:11.

2. Gịnị bụ ozi ọma ahụ?

Ezigbo ọchịchị dị ụmụ mmadụ mkpa. Ọ dịbeghị onye ọchịchị bụ́ mmadụ nke wepụụrụ ụmụ mmadụ ime ihe ike, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ. Ma, e nwere ozi ọma dịnụ. Chineke ga-enye ụmụ mmadụ ezigbo ọchịchị nke ga-eme ka ha nwere onwe ha n’ihe niile na-akpata ahụhụ.—Gụọ Daniel 2:44.

3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ịmụta ihe n’aka Chineke?

N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ekpochapụ ndị na-akpata ahụhụ n’ụwa. Ka ọ dịgodị, ọ na-akụziri ọtụtụ nde ndị dị umeala n’obi otú ha ga-esi bie ndụ ka mma, nke dabeere n’ịhụnanya. Okwu Chineke na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-edi nsogbu nke ndụ, otú ha ga-esi nweta ezi obi ụtọ, na otú ha ga-esi mee ihe dị Chineke mma.—Gụọ Zefanaya 2:3.

4. Ònye chepụtara Baịbụl?

E nwere akwụkwọ iri isii na isii na Baịbụl. Ọ bụ ihe dị ka iri ndị ikom anọ dere ha. Ọ bụ Mozis dere ise ndị mbụ n’ime ha ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Jọn onyeozi dere nke ikpeazụ n’ime ha ihe karịrị otu puku afọ na narị itoolu gara aga. Ma, ndị dere Baịbụl dere echiche Chineke, ọ bụghị nke ha. N’ihi ya, ọ bụ Chineke chepụtara Baịbụl.—Gụọ 2 Timoti 3:16; 2 Pita 1:21.

Anyị maara na Baịbụl si n’aka Chineke n’ihi na ọ na-ekwu kpọmkwem ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. O nweghị mmadụ ga-emeli ya. (Aịzaya 46:9, 10) Ọzọkwa, Baịbụl kọwara kpọmkwem ụdị onye Chineke bụ. O nwere ikike ime ka ndụ ndị mmadụ ka mma. Ihe ndị a emeela ka ọtụtụ nde mmadụ kwere na Baịbụl bụ Okwu Chineke.—Gụọ Jọshụa 23:14; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

5. Olee otú i nwere ike isi ghọta Baịbụl?

Jizọs ghọrọ onye e ji ịkụzi Okwu Chineke mara. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị ọ gwara okwu maara Akwụkwọ Nsọ, enyemaka dị ha mkpa iji ghọta ya. Iji nyere ha aka, Jizọs kwuru banyere ihe dị n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa “ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” Isiokwu a bụ́ “Mụta Ihe n’Okwu Chineke” ga-esikwa otú ahụ nyere gị aka.—Gụọ Luk 24:27, 45.

Isi n’aka Chineke mụta ihe bụ́ nzube nke ndụ na-eme ka mmadụ nwee ezi obi ụtọ. Ma ọ gaghị adị ụfọdụ ndị mma n’obi na ị na-agụ Baịbụl. Ekwela ka nke ahụ kụda gị obi. Ọ bụ ịmata Chineke ga-eme ka i nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi.—Gụọ Matiu 5:10-12; Jọn 17:3.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 2 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.