Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Ònye Bụ Chineke?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ha ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị iji nweta azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Ònye bụ Chineke?

Ọ bụ ezi Chineke kere ihe niile. Baịbụl kpọrọ ya “Eze mgbe ebighị ebi,” nke pụtara na o nweghị mmalite, ọ gaghịkwanụ enwe ọgwụgwụ. (Mkpughe 15:3) Ebe Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife ofufe.—Gụọ Mkpughe 4:11.

2. Olee otú Chineke dị?

Ọ dịghị onye hụtụrụla Chineke n’ihi na ọ bụ Mmụọ, nke pụtara na ọ bụ onye dị ndụ nke karịrị ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya bi n’ụwa. (Jọn 1:18; 4:24) A na-ahụ àgwà Chineke n’ihe ndị o kere. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị tụlere ụdị mkpụrụ osisi na okooko osisi dị iche iche e nwere na otú ha si maa mma, anyị na-ahụ ịhụnanya na amamihe Chineke. Otú eluigwe na ala si buo ibu na-egosi ike Chineke.—Gụọ Ndị Rom 1:20.

Anyị nwedịrị ike ịmụtakwu banyere àgwà Chineke na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ na-agwa anyị ihe na-amasị Chineke na ihe na-anaghị amasị ya, otú o si emeso ndị mmadụ, na ihe ọ na-eme n’ọnọdụ dị iche iche.—Gụọ Abụ Ọma 103:7-10.

3. Chineke ò nwere aha?

Jizọs kwuru, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọ bụ eziokwu na Chineke nwere ọtụtụ utu aha, o nwere naanị otu aha. Otú e si akpọ ya n’asụsụ dị iche iche abụghị otu. N’Igbo, a na-akpọkarị ya “Jehova.”—Gụọ Abụ Ọma 83:18.

E wepụla aha Chineke n’ọtụtụ Baịbụl ma jiri Onyenwe anyị ma ọ bụ Chineke dochie ya. Ma, mgbe e dere Baịbụl, aha Chineke pụtara na ya ihe dị ka puku ugboro asaa. Jizọs mere ka ndị mmadụ mara aha Chineke site n’ịkpọ ya mgbe ọ na-akọwara ha Okwu Chineke. O nyeere ndị mmadụ aka ịmata Chineke.—Gụọ Jọn 17:26.

4. Jehova ọ̀ na-eche banyere anyị?

Jehova na-egosi na o nwere mmasị n’ebe anyị nọ site n’ịnụrụ ekpere anyị n’onwe ya. (Abụ Ọma 65:2) Ahụhụ nke juru ebe niile ọ̀ na-egosi na Chineke anaghị eche banyere anyị? Ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke na-eme ka anyị taa ahụhụ iji lee anyị ule, ma nke a abụghị eziokwu. Baịbụl kwuru, sị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ.”—Job 34:10; gụọ Jems 1:13.

Chineke kwanyeere anyị ùgwù site n’inye anyị ohere ikpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme. Obi ọ́ dịghị anyị ụtọ na Chineke nyere anyị ohere ịhọrọ ijere ya ozi? (Jọshụa 24:15) Ihe mere ahụhụ ji ju ebe niile bụ na ọtụtụ ndị họọrọ ime ndị ọzọ ihe ọjọọ. Ọ na-ewute Jehova ịhụ ihe ọjọọ ndị dị otú ahụ.—Gụọ Jenesis 6:5, 6.

N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Jizọs wepụ ahụhụ na ndị na-akpata ya. Ka ọ dịgodị, Jehova nwere ezigbo ihe mere o ji kwere ka ahụhụ dịrịgodị. Ihe a ga-atụle n’isiokwu a n’ọdịnihu ga-eme ka ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị doo gị anya.—Gụọ Aịzaya 11:4.

5. Olee ihe Chineke chọrọ ka anyị mee?

Jehova kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịmata ya na ịhụ ya n’anya. Ọ chọrọ ka anyị mata eziokwu banyere ya. (1 Timoti 2:4) Ọ bụrụ na anyị amụọ Baịbụl, anyị nwere ike ịghọ ndị enyi Chineke.—Gụọ Ilu 2:4, 5.

Ebe Jehova nyere anyị ndụ, anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya karịa onye ọ bụla ọzọ. Anyị nwere ike igosi Chineke na anyị hụrụ ya n’anya site n’ịgwa ya okwu n’ekpere na ime ihe ọ gwara anyị mee. (Ilu 15:8) Jehova gwara anyị ka anyị jiri ịhụnanya na-emeso ndị ọzọ ihe.—Gụọ Mak 12:29, 30; 1 Jọn 5:3.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ Gịnị n’Ezie ka Bible Na-akụzi?isi 1 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ̀ ga-abụ na e nwere ezigbo ihe mere Chineke ji kwere ka ahụhụ dịrịgodị?