Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova hà na-ekwe ka a gwọọ ha ọrịa?

Ndịàmà Jehova hà na-ekwe ka a gwọọ ha ọrịa?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ndịàmà Jehova hà na-ekwe ka a gwọọ ha ọrịa?

▪ Jizọs kwuru na “mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.” (Matiu 9:12) Ihe a o kwuru na-egosi na Akwụkwọ Nsọ emegideghị mmadụ ịgakwuru dọkịta ka ọ gwọọ ya ọrịa. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-eji obi ụtọ anara ọgwụ ma kwe ka a gwọọ ha ọrịa. Ha chọrọ ka ahụ́ dị ha ike nakwa ka ha dị ogologo ndụ. N’ezie, ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova bụ ndị dọkịta, otú ahụ Luk bụ́ Onye Kraịst na narị afọ mbụ bụ.—Ndị Kọlọsi 4:14.

Ma, Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a gwọọ ha ọrịa otú megidere ụkpụrụ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ha anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara n’ihi na Baịbụl megidere ịmịnye mmadụ ọbara iji chebe ndụ ya. (Jenesis 9:4; Levitikọs 17:1-14; Ọrụ 15:28, 29) Okwu Chineke megidekwara ụdị ịgwọ ọrịa e ji “anwansi,” ma ọ bụ mgbaasị, agwọ.—Aịzaya 1:13; Ndị Galeshia 5:19-21.

Ọtụtụ ndị dọkịta na-agwọ ndị mmadụ otú na-agaghị emegide ụkpụrụ Baịbụl. Ọtụtụ mgbe, ụdị ịgwọ ọrịa dị otú ahụ, bụ́ nke ọtụtụ Ndịàmà na-ahọrọ, na-adị mma n’ahụ́ karịa ndị nke megidere iwu Chineke.

N’ezie, e nwere ọtụtụ echiche ma a bịa n’ihe metụtara ịgwọ ọrịa. Ihe nyeere otu onye aka nwere ike ọ gaghị enyere onye ọzọ aka. N’ihi ya, ndị na-achọ ka ndị ma nke a na-akọ chọpụta ihe na-arịa ha na otú a ga-esi gwọọ ha nwere ike ịchọ ịga ụlọ ọgwụ abụọ iji mata ọrịa ha na-arịa.—Ilu 14:15.

Otú otu Onyeàmà nwere ike ịchọ ka e si gwọọ ya nwere ike ịdị iche n’otú Onyeàmà ọzọ nwere ike ịchọ. Okwu Chineke nyere Ndị Kraịst ohere iji akọnuche ha kpebie ihe ha ga-eme mgbe mkpebi ha na-emebighị iwu Baịbụl. (Ndị Rom 14:2-4) N’ihi ya, onye nke ọ bụla kwesịrị ime nchọpụta banyere otú a chọrọ isi gwọọ ya ọrịa ma hụ na o megideghị akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ.—Ndị Galeshia 6:5; Ndị Hibru 5:14.

Onyeàmà ga-ewere mkpebi ọ bụla ọ chọrọ ime dị ka ebe ọkwọ ụgbọala na-abịarute ebe ụzọ wara agalaba nke ọtụtụ ndị na-agba. Ọ bụrụ na o soro nnọọ ụgbọala ndị nọ ya n’ihu kwofere ebe ahụ ụzọ wara agalaba n’elegharịghị anya, o nwere nnọọ ike imebi ihe. Ọkwọ ụgbọala maara ihe ga-akwụsịlata ma legharịa anya tupu ya etinyewe isi. N’otu aka ahụ, Ndịàmà anaghị eji ike eme mkpebi ndị metụtara otú a ga-esi agwọ ha ọrịa, ha anakwanụghị eso mkpebi ndị ọzọ mere n’ajụghị ase. Kama nke ahụ, ha na-atụle ụzọ dị iche iche e nwere ike isi gwọọ ha ọrịa, tụleekwa ihe Baịbụl kwuru tupu ha emee mkpebi.

N’ezie, Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ maka mbọ ndị dọkịta na-agba na otú ha si ewepụta onwe ha ịgwọ ndị ọzọ. Obi na-adịkwa ha ụtọ maka ọrịa ha na-agwọ ndị mmadụ.