Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a . . . ”—MATIU 24:14.

NDỊ KRAỊST ga-ekwusa “ozi ọma . . . nke alaeze” site n’ịgwa ndị ọzọ maka ya, na-akọwara ha na Alaeze ahụ bụ ọchịchị nke ga-achị ụwa dum n’ezi omume n’ọdịnihu. Ma, e kwukwara okwu banyere ụdị “ozi ọma” ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e kwuru banyere “ozi ọma banyere nzọpụta” (Abụ Ọma 96:2); “ozi ọma banyere Chineke” (Ndị Rom 15:16); na “ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.”—Mak 1:1.

Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ihe ndị so n’ozi ọma ahụ bụ eziokwu niile Jizọs kwuru okwu ha na ndị ndị na-eso ụzọ ya dere banyere ha. Tupu Jizọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ya mere, ọrụ ezi Ndị Kraịst abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ; ha ga-agbarịrị mbọ ime ndị na-eso ụzọ.

Olee otú chọọchị dị iche iche na-eme na nke a? Ọtụtụ n’ime ha aghọtaghị ihe Alaeze ahụ bụ. N’ihi ya, ha enweghị ike ịkụziri ya ndị ọzọ nke ọma. Kama nke ahụ, ha na-ekwu okwuchukwu ire ụtọ banyere mgbaghara mmehie na inwe okwukwe na Jizọs. Ha na-agbakwa mbọ inweta ndị na-eso ụzọ ha site n’ịrụ ọrụ ebere ma ọ bụ ịrụ ụlọ ọgwụ, ụlọ akwụkwọ na ịrụrụ ndị ogbenye ụlọ. Ọ bụ ezie na ụdị mbọ ahụ nwere ike ime ka ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị mụbaa, ha anaghị eme ka ndị mmadụ ghọọ ezi Ndị Kraịst ji obi ha dum na-achọ ibi ndụ kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziri.

Otu ọkà mmụta okpukpe dere, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ma ọ bụ ndị ndú okpukpe Ndị Kraịst kweere na anyị kwesịrị imere Jizọs ndị na-eso ụzọ ma kụziere ha ime ihe niile Jizọs kwuru. . . . A sị ka e kwuwe, ntụziaka Jizọs nyere n’okwu a doro nnọọ anya. Ọ bụ naanị na anyị anaghị eme ihe o kwuru. Anyị anaghị eji obi anyị niile anwa ime ya. O dokwara anya na anyị amaghị otú e si eme ya.”

N’otu aka ahụ, ajụjụ a jụrụ ndị na-ekpe Katọlik n’Amerịka gosiri na ihe dị ka mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla a jụrụ ajụjụ kwetara na chọọchị ha chọrọ ka ha na-ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ chere na ụzọ kacha mma e kwesịrị isi mee nke a bụ ha ibi ndụ otú ga-abụrụ ndị ọzọ ihe nlereanya, ọ bụghị ikwu ya n’ọnụ. Otu n’ime ndị a jụrụ echiche ha kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma abụghị okwu ọnụ efu. Ndụ anyị kwesịrị ịbụ Ozi Ọma n’onwe ya.” Ụlọ ọrụ na-ebipụta magazin bụ́ U.S. Catholic, nke mere nchọpụta ahụ, kwuru na ọtụtụ ndị anaghị achọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere n’ihi “aha ọjọọ chọọchị ahụ nwere n’ihi akụkọ ndị a kọrọ n’oge na-adịbeghị anya banyere otú ndị isi chọọchị si emetọ ụmụaka nakwa n’ihi ozizi chọọchị ndị na-ese okwu.”

N’ebe ọzọ, otu bishọp Chọọchị Metọdist kwuru na chọọchị ya kewara ekewa ma nọrọ ná mgbagwoju anya, na obi anaghị aka ha ịrụ ọrụ ha, nakwa na àgwà ha adịchaghị iche n’àgwà mmadụ niile na-akpa. O ji mwute jụọ, sị: “Olee ndị ji ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze kpọrọ ihe?”

Bishọp ahụ azaghị ajụjụ ahụ ọ jụrụ. Ma, azịza ya dị adị. Ị ga-ahụ ya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ozi ọma ahụ bụ banyere ma Alaeze Chineke ma nzọpụta site n’inwe okwukwe na Jizọs Kraịst