Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbachitere Ezi Ofufe!

Gbachitere Ezi Ofufe!

Maka Ndị Na-eto Eto

Gbachitere Ezi Ofufe!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Ịlaịja, Ehab, na narị ndị amụma Bel anọ na iri ise

Ihe a kọrọ: Ịlaịja gosiri na Jehova karịrị Bel.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ 1 NDỊ EZE 18:17-40.

Were mpempe akwụkwọ ọzọ see ebe i chere Ịlaịja nọ, ebe ndị amụma Bel nọ, nakwa ebe ebe ịchụàjà ndị ahụ dị.

Olee ụdị ụda ị na-anụ mgbe ihe ahụ a kọrọ n’amaokwu nke 26 ruo nke 29 na-eme?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Ịlaịja mgbe ọ na-agwa ndị amụma Bel okwu?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Gịnị mere obi ike ji dị Ịlaịja mkpa mgbe ọ chọrọ ịgakwuru Ehab na mgbe ọ chọrọ igosi chi nke bụ́ ezi Chineke, bụ́ nke ga-emechu ọtụtụ narị ndị amụma Bel ihu? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Ndị Eze 18:4, 13, 14.)

․․․․․

Jiri ihe e ji eme nchọnchọ i nwere chọpụta ihe ụfọdụ banyere ofufe Bel. Dị ka ihe atụ, olee omume ndị a na-eme mgbe a na-efe Bel? Olee otú ofufe Bel si metụta ndị Izrel?

․․․․․

Olee ihe i chere mere Ịlaịja ji gwuo olulu gburugburu ebe ịchụàjà Jehova ma kwuo ka a gbajuo ya mmiri?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Obi ike mmadụ kwesịrị inwe iji gbachitere ezi ofufe.

․․․․․

Uru ndị nwere ụdị obi ike ahụ na-erite.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Olee ebe ma ọ bụ ebe ndị i nwere ike igosikwu obi ike iji na-agbachitere ezi ofufe?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị baịbụl, gwa ndịàmà jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị amatakwuo banyere ya na www.watchtower.org na www.dan124.com