Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya
Amụma nke 4. Ndị Mmadụ Agaghị Ahụ Ibe Ha N’anya
“Ndị mmadụ . . . agaghị ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya.”—2 TIMOTI 3:1-3, nsụgharị bụ́ God’s Word Bible
● Chris na-arụrụ otu òtù nọ na Briten ọrụ, bụ́ nke na-enyere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eti ihe aka. Chris kwuru, sị: “M na-echeta otu nwaanyị nke bịakwutere m otu ụbọchị, otú e si tikasịa ya ahụ́ mere ka m ghara ịmatazi onye ọ bụ. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-abịa n’ụlọ ọrụ anyị na-anọ ná mwute nke na ha anaghị enwe ike iwelite ihu elu.”
GỊNỊ KA IHE NDỊ NA-EME EME NA-EGOSI? N’otu mba dị n’Afrịka, ihe dị ka otu nwaanyị n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla enweela mgbe e metọrọ ya n’oge ọ bụ nwata. Otu nnyocha e mere ná mba ahụ gosiri na otu nwoke n’ime ụmụ nwoke atọ ọ bụla kwuru na o nweghị ihe dị njọ ma nwoke tie nwunye ya ihe. Ma, ọ bụghị naanị ụmụ nwoke na-eti ụmụ nwaanyị ihe. Dị ka ihe atụ, na Kanada, ihe dị ka ụmụ nwoke atọ n’ime ụmụ nwoke iri ọ bụla ka ndị nwunye ha na-eti ihe.
GỊNỊ KA NDỊ NA-EKWEGHỊ NÁ MMEZU AMỤMA A NA-EKWUKARỊ? Ọ bụghị taa ka nwoke iti nwunye ya ihe ma ọ bụ nwaanyị iti di ya ihe malitere. Ọ bụ naanị na ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge a karịa ka ọ dị n’oge ndị gara aga.
IHE AHỤ HA KWURU Ò RIJURU AFỌ? N’eziokwu, ndị mmadụ amatakwuola banyere nsogbu a n’oge ndị a. Ma, ndị mmadụ ịmatakwu nsogbu a ò meela ka ọ kwụsịlata? Mbanụ! Ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya na-ebukwu ibu.
GỊNỊ KA I CHERE? Ihe e kwuru na 2 Timoti 3:1-3 ọ̀ na-emezu? Ọ́ bụghị eziokwu na e nwere ọtụtụ ndị na-ahụghị ndị ezinụlọ ha n’anya?
Amụma nke ise i ji anya gị na-ahụ ka ọ na-emezu metụtara ụwa anyị a. Ka anyị tụlee ihe Baịbụl kwuru banyere ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“E kwuola na mmadụ iti di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe bụ otu n’ime ihe ọjọọ ndị mmadụ kacha ezo ezo. Tupu nwaanyị agaa kọọrọ ndị uwe ojii na di ya na-eti ya ihe, ọ ga-abụ na di ya etielaya ihe ihe dị ka ugboro iri atọ na ise.”—OTU NWAANYỊ BỤ́ ỌNỤ NA-EKWUCHITERE ÒTÙ NỌ NA BRITEN NKE NA-ENYERE NDỊ DI HA MA Ọ BỤ NWUNYE HA NA-ETI IHE AKA.