“Ndị Mmadụ Hà Ga-emebi Ụwa a?”
“Ndị Mmadụ Hà Ga-emebi Ụwa a?”
● Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’ọnwa lee ụwa anyị a anya, ọ ga-ahụ na ụwa anyị a mara ezigbo mma, na-egbukekwa egbuke. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ abịa nso leruo ya anya, ọ ga-achọpụta na ụwa anyị a nọ ná nsogbu. Ọ̀ bụ maka gịnị? Azịza ya dị mfe: Ọ bụ maka na ụmụ mmadụ na-emebisị ya. Mmebi ha na-emebi ụwa abụghị naanị imetọ ikuku, igbukpọsị oké ọhịa, iwekọrọsị akụ̀ ndị dị n’ime ala, kamakwa omume ọjọọ ha ndị dị ka ime ihe ike, ịkwafu ọbara, na ịkwa iko, sokwa na-emebi ụwa ma na-eme ka ndị mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma.
N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e buru amụma na Baịbụl na ihe ga-adị njọ otú ọ dị ugbu a n’ụwa. (2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 11:18) Baịbụl kwukwara na ọ bụ Chineke ga-edozi nsogbu niile dị n’ụwa, ọ bụghị mmadụ. A ga-akọwa ihe ndị a dị mkpa n’okwu a ga-agwa ọhaneze nke isiokwu ya bụ, “Ndị Mmadụ Hà Ga-emebi Ụwa A?” Ebe a ga-ekwu okwu a bụ ná Mgbakọ Distrikti Ndịàmà Jehova nke isiokwu ya bụ “Ka Alaeze Chineke Bịa!” Mgbakọ a ga-amalite n’ọnwa Septemba na Naịjirịa, ma a ga-enwekwa ya n’ebe ndị ọzọ n’ụwa.
Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị gaa mgbakọ a n’ebe kacha gị nso. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere mgbakọ a, biko, jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè unu ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ ozi. E dere ebe dị iche iche a ga-enwe mgbakọ a na Naịjirịa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.dan124.com.