Ozi Ọma Maka Ndị Ogbenye
Ozi Ọma Maka Ndị Ogbenye
OKWU CHINEKE kwuru ihe ga-eme ka obi tọọ anyị ụtọ, sị: “Ọ bụghị mgbe niile ka a ga-echefu ogbenye.” (Abụ Ọma 9:18) Baịbụl kwukwara banyere Onye kere anyị, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (Abụ Ọma 145:16) Ihe ndị a Okwu Chineke kwuru abụghị akụkọ ifo. Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ike inye anyị ihe ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye. Gịnị bụ ihe ahụ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye?
Otu onye Afrịka bụ́ ọkachamara n’ihe banyere akụnụba mba dị iche iche kwuru na ihe ga-egbo mkpa mba ndị dara ogbenye bụ inwe “onye ọchịchị siri ike, nke nwekwara obiọma.” Ihe ọ na-ekwu bụ na tupu ịda ogbenye akwụsị n’ụwa, a ga-enwe onye ọchịchị nke ga-eji ike ya na obiọma ya gbanwee ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ na-ada ogbenye. Ọ dịkwa mma ikwu na onye ọchịchị ahụ kwesịrị ịbụ onye ga-achị ụwa niile n’ihi na ihe na-emekarị ka ndị mmadụ daa ogbenye bụ na mba ụfọdụ bara ọgaranya, mba ndị ọzọ adaa ogbenye. Ihe ọzọkwa bụ na onye ọchịchị nke ga-akwụsịli ịda ogbenye kwesịrị ịbụ onye nwere ike ịkwụsị ihe na-akpata ịda ogbenye, nke bụ́ ụmụ mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ha. Ebee ka a ga-ahụ onye ọchịchị dị otú ahụ?
Chineke zitere Jizọs ka o zie ndị ogbenye ozi ọma. Mgbe Jizọs guzoro ọtọ ka ọ gụpụtara ndị mmadụ ọrụ Chineke zitere ya ka ọ rụọ, ọ sịrị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma.”—Luk 4:16-18.
Gịnị Bụ Ozi Ọma?
Chineke mere Jizọs eze. Nke a bụ nnọọ ozi ọma. Ihe mere Jizọs ji bụrụ Onye ọchịchị nke ruru eru ime ka ịda ogbenye kwụsị bụ na (1) ọ ga-achị mmadụ niile, ọ dịkwa ike; (2) ọ na-emetere ndị ogbenye ebere, ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-enyere ndị ogbenye aka; (3) o nwekwara ike ịkwụsị ihe na-eme ka ndị mmadụ daa ogbenye, ya bụ, ndị mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ha, nke bụ́ ihe dị anyị n’ọbara. Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe atọ a e kwuru banyere Jizọs.
1. Jizọs ga-achị ụwa niile Okwu Chineke kwuru banyere Jizọs, sị: “E wee nye ya ọchịchị . . . ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.” (Daniel 7:14) Chegodị uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na ọ bụ otu onye na-achị mmadụ niile? Ndị mmadụ agaghị esezi okwu ma ọ bụ na-alụ ọgụ ebe ha na-azọ akụ̀ ndị dị n’ụwa. Onye ọ bụla ga-enweta ihe niile otú ibe ya nwetara. Jizọs n’onwe ya kwuru ihe gosiri na ọ bụ Onye dị ike nke ga-achị ụwa. Ọ sịrị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”—Matiu 28:18.
2. Jizọs na-emetere ndị ogbenye ebere N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o meteere ndị ogbenye ebere. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị nke mefuru ihe niile o nwere ebe ọ na-achọ ka a gwọọ ya ọrịa. Nwaanyị ahụ metụrụ uwe Jizọs aka, buru n’obi na ahụ́ ga-adị ya mma. Ọ rịala ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ, o dokwara anya na ọbara adịkwaghị ya n’ahụ́. Iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru na ọ bụrụ na onye nwere ụdị ọrịa a emetụ mmadụ aka, onye o metụrụ aka agaghịzi adị ọcha. Ma Jizọs meteere nwaanyị ahụ ebere. Ọ sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”—Mak 5:25-34.
Ihe Jizọs kụziri nwere ike ịgbanwe obi ndị mmadụ, mee ka ha mụta imetere ndị ọzọ ebere. Dị ka ihe atụ, legodị ihe Jizọs gwara otu nwoke nke chọrọ ịmata otú ọ ga-esi mee ihe dị Chineke mma. Nwoke ahụ maara na Chineke chọrọ ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya, ma ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?”
Jizọs ji otu akụkọ ọtụtụ ndị maara taa zaa ya ajụjụ ahụ. Ọ bụ akụkọ otu nwoke nke si Jeruselem Luk 10:25-37.
na-aga Jeriko. Ndị ohi naara nwoke a ihe niile o ji, tie ya ihe ma hapụ ya “ọdị ndụ ọnwụ ka mma.” Mgbe otu onye nchụàjà rutere ebe nwoke ahụ tọgbọ, o si ụzọ ọzọ gafere. Otu onye Livaị nke rutere ebe ahụ mekwara otu ihe ahụ. “Ma otu onye Sameria nke si n’ụzọ ahụ na-agafe rutere n’ebe ọ nọ na mberede, mgbe ọ hụrụ ya, o nwere ọmịiko.” Ọ gakwuuru nwoke ahụ, kechie ọnyá ya, kpọgakwa ya n’ụlọ ndị njem ma nye onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ ego ọ ga-eji lekọta ya. Jizọs jụziri onye ahụ jụrụ ya ajụjụ, sị: “Ònye . . . gosiri na ya bụ onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” Ihe ọ zara bụ: “Ọ bụ onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.” Jizọs sịziri ya: “Gị onwe gị, na-emekwa otú ahụ.”—Ndị chọrọ ịghọ Ndịàmà Jehova na-amụ ụdị ihe a Jizọs kụziri ma mụta inyere ndị nọ ná nsogbu aka. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Women in Soviet Prisons, otu onye Latvia nke na-ede akwụkwọ kọrọ ihe mere n’otu oge ọ rịara ọrịa, n’ihe dị ka afọ 1965. N’oge ahụ, ọ na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ dị na Potma. Ọ sịrị: “N’oge ahụ m rịara ọrịa, [Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ] lekọtara m ezigbo anya. Amaghị m ma è nwekwara ndị ọzọ gaara elekọta m otú ahụ.” Ọ sịkwara: “Ndịàmà Jehova weere na iwu ji ha inyere ndị ọzọ aka n’agbanyeghị obodo ndị ahụ si ma ọ bụ okpukpe ha na-ekpe.”
E nwere mgbe ihe siiri ụfọdụ Ndịàmà Jehova bi n’obodo Ankọn nke dị na Ekwedọọ ike. Ha enweghị ọrụ ma ọ bụ ego, n’ihi ya, Ndịàmà Jehova ibe ha kwekọrịtara na ha ga-enyere ha aka. Ha kwuru na ha ga-esi nri ma resị ya ndị na-akụ azụ̀, bụ́ ndị si ịkụ azụ̀ n’abalị alọta (lee foto a dị ebe a). Ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ, ma ụmụaka, so sie nri ahụ. Ha bidoro n’elekere mbụ nke etiti abalị, ka ha nwee ike isicha nri ha chọrọ isi mgbe ndị ga-eri ya ga-alọta n’elekere anọ nke isi ụtụtụ. Ha keere ndị niile ihe siiri ike ego ha nwetara otú mkpa ha nwere hà.
Ụdị akụkọ a na-egosi na ihe Jizọs mere na ihe ndị ọ kụziri na-eme ka ndị mmadụ mụta inyere ndị ihe siiri ike aka.
3. Jizọs nwere ike inyere ụmụ mmadụ aka ịgbanwe àgwà ọjọọ ndị dị ha n’ọbara O doro onye ọ bụla anya na mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ya dị anyị niile n’ọbara. Baịbụl kpọrọ ya mmehie. Pọl onyeozi dere, sị: “M na-achọpụta iwu a n’ebe m nọ: na mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” O kwukwara, sị: “Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a? Ekele dịrị Chineke site n’aka Jizọs Kraịst.” (Ndị Rom 7:21-25) Ihe Pọl na-ekwu n’ebe a bụ na Chineke ga-esi n’aka Jizọs mee ka ndị niile na-efe Chineke kwụsị ịchọ naanị ọdịmma onwe ha, nke bụ́ otu n’ime mmehie ndị dị anyị n’ọbara, nke bụ́kwa isi ihe mere ndị mmadụ ji ada ogbenye. Olee otú ọ ga-esi eme nke a?
Mgbe e mechara Jizọs baptizim, ụbọchị ole na ole agafeekwa, Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ndị mmadụ onye Jizọs bụ. Ọ sịrị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) N’oge na-adịghị anya, ndị niile bi n’ụwa ga-abụ ndị na-anaghịzi eme mmehie, ndị na-anakwaghị achọ naanị ọdịmma onwe ha. (Aịzaya 11:9) N’oge ahụ, Jizọs ewepụla ihe ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-ada ogbenye.
Chegodị ụdị obi ụtọ ndị mmadụ ga-enwe mgbe onye ọ bụla ga-enwe ihe ndị na-akpa ya! Okwu Chineke sịrị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) Amaokwu a na-akọwa otú ụwa ga-adị mgbe mmadụ niile ga-enwe ọrụ na-enye ha obi ụtọ, ahụ́ eruo ha niile ala, o nweghịkwa onye ga-abụ ogbenye. N’oge ahụ, mmadụ niile ga na-enye Jehova otuto.