Ụwa Ọ̀ Ga-agwụ n’Afọ 2012?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Ụwa Ọ̀ Ga-agwụ n’Afọ 2012?
▪ “Ọtụtụ ndị na-akwatazi n’otu obere obodo dị na Frans . . . Ndị a bụ ndị kweere na ụwa ga-agwụ n’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Disemba afọ 2012, nke bụ́ mgbe puku afọ ise, otu narị afọ na iri afọ abụọ na ise e nwere na kalenda ndị Maya oge ochie ga-agwụ.”—Akụkọ Si n’Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Bụ́ BBC.
N’agbanyeghị ihe ndị isi okpukpe ndị na-ekwukarị na a ga-ebibi ụwa ma ọ bụ ndị sị na ha bụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu, ma ọ bụkwanụ ihe ndị na-asị na ha ma ihe ga-eme n’ọdịnihu na-ekwu, o nweghị ihe ga-eme ụwa a. Afọ 2012 ga-abịa gafee. Ọ bụghị naanị na afọ 2012 ga-abịa gafee, afọ ndị ọzọ ga na-abịakwa na-agafe, ụwa adịrịkwa.
Baịbụl gwara anyị, sị: “Otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa; ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.” (Ekliziastis 1:4) Chebarakwa ihe a e kwuru n’Aịzaya 45:18 echiche: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, . . . Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya, Onye mere ka o guzosie ike, onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya: ‘Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.’”
Nna nke hụrụ nwa ya n’anya ọ̀ ga-ewepụta oge rụọrọ nwa ya ihe ọ ga-eji na-egwuri egwu, obere oge, ya anara ya ihe ahụ ọ rụụrụ ya mebie? Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, a ga-asị na obi fere ya azụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke, isi ihe mere o ji kee ụwa bụ ka ụmụ mmadụ biri na ya na-enwe obi ụtọ. Chineke gwara di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” Mgbe Chineke kechara ihe niile, ọ “hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:27, 28, 31) Chineke agbanwebeghị ihe o bu n’obi kee ụwa; ọ gaghị ekwe ka e bibie ụwa. Jehova kwuru banyere nkwa ndị o kwere, sị: “Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.”—Aịzaya 55:11.
Ma, Jehova kwuru na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Na Baịbụl, o kwere nkwa, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya. Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.”—Ilu 2:21, 22.
Olee mgbe ihe a ga-eme? O nweghị mmadụ ọ bụla maaranụ. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m maara.” (Mak 13:32) Ndịàmà Jehova anaghị aga kwuwe ụbọchị ha chere Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume. Ọ bụ eziokwu na ha na-ahụ nnọọ “ihe ịrịba ama” ndị na-egosi na anyị bi n’oge ọgwụgwụ, kwerekwa na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ,” ha amaghị kpọmkwem mgbe “ọgwụgwụ” ahụ ga-abịa. (Mak 13:4-8, 33; 2 Timoti 3:1) Ha ma na ọ bụ naanị Nna ha nke eluigwe na Ọkpara ya ma mgbe ọ ga-abụ.
Ihe Ndịàmà Jehova na-emegodị ugbu a bụ ikwusa oziọma Alaeze Chineke. Alaeze a bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs nke udo ga-adị na ya, bụ́ ebe ‘ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.’—Abụ Ọma 37:29.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 10]
Image Science and Analysis Laboratory, NASA-Johnson Space Center