Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”

A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”

NNUKWU mmiri zowe, i nwere ike ịnụ ụda égbè eluigwe. Ò nwetụla mgbe égbè eluigwe gbara ụjọ atụwa gị? * Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya abụọ “Ụmụ Égbè Eluigwe.” Ka anyị chọpụtagodị ihe kpatara ya.

Mmadụ abụọ ahụ Jizọs kpọrọ “Ụmụ Égbè Eluigwe” bụ Jems na Jọn. Ha bụ ụmụnne. Papa ha bụ Zebedi, mama ha abụrụ Salomi. Ọ ga-abụ na Salomi bụ nwanne Meri, bụ́ mama Jizọs. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Jems na Jọn bụ ụmụ nwanne mama Jizọs, o nwekwara ike ịbụ na ha na Jizọs bụ ezigbo enyi mgbe ha na-eto.

Zebedi bụ onye na-akụ azụ̀, Jems na Jọn bụkwa ndị na-akụ azụ̀. Jems na Jọn so ná ndị mbụ Jizọs họọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe ọ kpọrọ ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ ozugbo ma soro ya. Jizọs mechara họpụta mmadụ iri na abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ ndịozi ya. Jems na Jọn sokwa ná ndị ahụ ọ họpụtara.

Ọnwa ole na ole tupu e gbuo Jizọs, e nwere ụbọchị ya na ndịozi ya si n’otu obodo dị na Sameria na-agafe. Mgbe chi jiwere, ike gwụchara ha, ha achọọkwa ịrahụ n’obodo ndị Sameria. Ma, ndị Sameria achọghị ka Jizọs na ndịozi ya rahụ n’obodo ha. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ka anyị hụ.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bụ ndị Juu, ọtụtụ ndị Juu kpọkwara ndị Sameria asị. Ma Jizọs akpọghị ndị Sameria asị. Ọ na-emeso ha omume ọma, Jems na Jọn kwesịkwara ime ka Jizọs. Ma, mgbe ndị Sameria na-achọghị ka Jizọs na ndịozi ya rahụ n’obodo ha, iwe jidere Jems na Jọn, ha ajụọ Jizọs, sị: “Ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” Gịnị ka i chere Jizọs gwara ha?— Ọ baara ha mba maka ikwu ụdị ihe ahụ. Jems na Jọn kwesịrị ịmụtakwu imere ndị ọzọ ebere.

Ihe ọzọ na-adịghị mma Jems na Jọn mere bụ na ha chọrọ ịbụ ndị mbụ, ndị kacha mkpa n’ime ndịozi Jizọs. Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ha gwara mama ha ka ọ gaa gwa Jizọs, sị: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ a nọdụ ala, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.” Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ, bụ́ ndịozi Jizọs, nụrụ ihe a Jems na Jọn mere, iwe were ha. Ọ bụrụ na i so ná ndịozi ahụ, iwe ọ̀ gaara ewe gị?

O nwere ike iwe gị. Ọ naghị adị anyị mma ma ndị ọzọ na-achọ ka ha bụrụ ndị mbụ ma ọ bụ na-achọ ime ka hà dị mkpa karịa ndị ọzọ. Jems na Jọn mechara mata na otú ha si eme adịghị mma, ha gbanwekwara. Ha bịaziri mesowa ndị ọzọ omume ọma ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Gịnị ka nke a na-akụziri anyị?

Otu ihe anyị na-amụta n’aka Jizọs bụ na anyị kwesịkwara ịna-emeso ndị ọzọ omume ọma. Jizọs mesoro ndị mmadụ omume ọma, ma ụmụ nwoke, ma ụmụ nwaanyị, ma ụmụaka. Ị̀ ga na-agbalị icheta otú Jizọs si mesoo ndị ọzọ ma na-eme otú ahụ o mere?

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

Mak 3:17

Matiu 27:55, 56; Mak 15:40, 41

Matiu 4:18-22

Jọn 4:4-15, 21-26; Luk 9:51-55

Matiu 20:20-24; Mak 10:35-37, 41

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.