Ebreham Nwoke Nwere Okwukwe
Ebreham Nwoke Nwere Okwukwe
Otu abalị, Ebreham guzo n’èzí lelie anya elu, na-ele kpakpando juru eluigwe ma na-eche banyere nkwa Chineke kwere ya nke bụ́ na mkpụrụ ya ga-adị ọtụtụ ka kpakpando ndị ahụ. (Jenesis 15:5) Kpakpando ndị ahụ na-echetara ya nkwa Jehova kwere ya. Ha na-emekwa ka obi sie ya ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. A sị ka e kwuwe, ebe ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha, ọ̀ bụ na ọ gaghị emeli ka ya na nwunye ya, bụ́ Sera, mụta nwa? N’eziokwu, Ebreham kwenyesiri ike na Chineke ga-emezu nkwa ya.
GỊNỊ BỤ OKWUKWE? Na Baịbụl, okwukwe pụtara mmadụ ikwere n’ihe ọ na-anaghị ahụ anya n’ihi na e nwere ezigbo ihe mere o ji kwere n’ihe ahụ. Onye nwere okwukwe na Chineke na-elekwasị anya n’otú Chineke ga-esi emezu nkwa ndị o kwere, obi na-esikwa ya ike na Chineke ga-emezurịrị ha.
OLEE OTÚ EBREHAM SI GOSI NA YA NWERE OKWUKWE? Ebreham gosiri na ya kweere na Chineke ga-emezu nkwa ya. N’ihi okwukwe Ebreham nwere, ọ hapụrụ obodo a mụrụ ya, obi sikwara ya ike na Jehova ga-emezu nkwa Ya nke bụ́ igosi ya ala ebe ọ ga-akwaga. Ọ bụ okwukwe Ebreham mere o ji gagharịa n’ala Kenan, obi esiekwa ya ike na ụmụ ya ga-emecha biri n’ala ahụ. Ọ bụkwa okwukwe ya mere o ji chọọ ịchụ nwa ya n’àjà mgbe Jehova gwara ya mee otú ahụ, obi sikwara ya ike na Jehova ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.—Ndị Hibru 11:8, 9, 17-19.
Ebreham lekwasịrị anya n’ihe ndị dị n’ihu, ọ bụghị n’ihe ndị ọ hapụrụ. O nwere ike ịbụ na ihe dịịrị Ebreham na Sera mma na Ọọ karịa ka ọ dịịrị ha na Kenan, ma ha anọghị “na-echeta ebe ahụ ha si pụọ.” (Ndị Hibru 11:15) Kama nke ahụ, ha nọ na-echeta otú Chineke ga-esi gọzie ha na ụmụ ha n’ọdịnihu.—Ndị Hibru 11:16.
Okwukwe ahụ Ebreham nwere na Chineke ọ̀ ghọrọ ya ahịa? Mbanụ! Jehova mezuru nkwa niile o kwere Ebreham. Ụmụ Ebreham mechara mụbaa ghọọ mba a na-akpọ Izrel. Ndị Izrel mechara biri na Kenan, bụ́ ala Jehova kwere Ebreham nkwa na ọ ga-enye ya.—Jọshụa 11:23.
GỊNỊ KA ANYỊ NA-AMỤTA N’AKA YA? Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ n’ime nkwa ndị ahụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume, anyị kwesịrị icheta na “n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:26.
Ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham bụ na anyị ekwesịghị ịnọ na-eche banyere otú ihe si dịrị anyị mma na mbụ, kama anyị kwesịrị ịna-echeta ihe ọma ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe a ka otu nwoke aha ya bụ Jason mụtara. Jason na-arịa ọrịa nke mere ka ahụ́ ya kpọnwụọ. Ọ sịrị: “N’eziokwu, o nwere mgbe m na-echeta mgbe ahụ́ dị m mma. Ihe kacha ewute m bụ ụmụ obere ihe ndị m na-anaghị enwezi ike ime ugbu a, dị ka ịmakụ nwunye m bụ́ Amanda.”
Ma, Jason nwere nnọọ okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere, ma nkwa ya nke bụ́ ime ka ụwa bụrụ paradaịs ebe ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi, mgbe a na-agaghị enwekwa onye ga-arịa ọrịa. * (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Aịzaya 35:5, 6; Mkpughe 21:3, 4) Jason sịrị: “M na-echetara onwe m na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.” O kwukwara, sị: “Nsogbu m niile ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya, . . . . ha niile ga-aghọ ihe akụkọ.” Jason nwere nnọọ okwukwe yiri nke Ebreham!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs n’ọdịnihu, gụọ isi nke 3, nke 7, na nke 8 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.