Gịnị Ka Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Nwa Gị Achọkwaghị Iso Gị Ekpe Okpukpe Ị Na-ekpe?
Ihe Ndị Na-eme Ka E nwee Obi Ụtọ N’ezinụlọ
Gịnị Ka Ị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Nwa Gị Achọkwaghị Iso Gị Ekpe Okpukpe Ị Na-ekpe?
Ka ụmụaka na-etolite, ọtụtụ n’ime ha na-ekpebi iso ndị mụrụ ha kpewe okpukpe ha. (2 Timoti 3:14) Ma ụfọdụ anaghị eme otú ahụ. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị na-etolite etolite agwa gị na ya achọghịzi iso gị ekpe okpukpe ị na-ekpe? Isiokwu a ga-eleba anya n’ihe ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme ma ụdị ihe a mee.
“Achọghịzi m iso ndị mụrụ m na-ekpe okpukpe ha na-ekpe. Ike ya agwụla m.”—Cora, 18. *
O DORO gị anya na okpukpe ị na-ekpe na-akụzi eziokwu banyere Chineke. I kwekwaara na Baịbụl na-akụziri anyị ụzọ kacha mma isi bie ndụ. Ọ bụkwa ihe ndị a mere i ji na-akụziri nwa gị ihe ndị i kweere. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ma gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị asị na ya achọghịzi ife Chineke? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o kwetaghịzi ihe ndị o kwetara mgbe ọ bụ nwata?—Ndị Galeshia 5:7.
Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, echela na ị zụghị nwa gị otú ezigbo nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst kwesịrị isi zụọ nwa ya. E nwere ike inwe ihe ndị ọzọ mere nwa gị ji kwuo ụdị ihe ahụ, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu a. Ma buru nke a n’uche: Ihe i mere mgbe nwa gị gwara gị na ya achọkwaghị iso gị ekpe okpukpe ị na-ekpe ga-eme ka o sosiwe gị ike ma ọ bụ mee ka ọ kwụsịchaa iso gị. Ọ bụrụ na i sie ọnwụ na nwa gị ga-eso gị na-ekpe okpukpe ị na-ekpe, o doro anya na ị gaghị achịta ájá.—Ndị Kọlọsi 3:21.
Ọ ka mma ime ihe a Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, onye ruru eru izi ihe, onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ.” (2 Timoti 2:24) Olee otú ị ga-esi gosi na i “ruru eru izi ihe” ma ọ bụrụ na nwa gị agwa gị na ya achọkwaghị iso gị ekpe okpukpe ị na-ekpe?
Chọpụta Ihe Bụ́ Nsogbu Ya
Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịgba mbọ chọpụta ihe kpatara ya. Dị ka ihe atụ:
▪ Ọ̀ ga-abụ na ọ na-adị ya ka o nweghị ndị enyi n’ọgbakọ ebe unu na-aga amụ Baịbụl? “Achọrọ m inwe ndị enyi, emetekwara m ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ibe m enyi. Nke a mere ka m ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ruo ọtụtụ afọ. Ndị enyi ọjọọ mụ na ha na-akpa mere ka m ghara inwekwa
mmasị n’ofufe Chineke, ugbu a m na-akwa mmakwaara.”—Lenore, onye dị afọ iri na itoolu.▪ Ọ̀ ga-abụ na ụjọ na-atụ ya ịgwa ndị ọzọ ihe ndị o kweere? “Mgbe m ka na-aga akwụkwọ, ọ na-esiri m ike ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe m ihe ndị m kweere. Ụjọ na-atụ m na ha ga-elewe m anya ka onye ime ọhịa, ma ọ bụ kpọwa m ‘onye nsọ.’ Ụmụ akwụkwọ na-agbara nwa akwụkwọ ibe ha ọsọ ma ọ bụrụ na ọ naghị eso ha eme ihe ha na-eme, achọghịkwa m ka ha gbawara m ọsọ.”—Ramón, onye dị afọ iri abụọ na atọ.
▪ Ọ̀ ga-abụ na ọ na-adị ya ka ọ gaghị ebili ndụ otú Onye Kraịst kwesịrị ibi? “Ọ na-adị m ka ndụ ebighị ebi Baịbụl na-ekwu okwu ya ọ dị n’ebe aka m na-agaghị eru. Ebidobeghịdị m ime ihe ndị m kwesịrị ime iji nweta ya. Ụjọ ibido ime ihe ndị ahụ na-atụ m nke na ọ na-adịzi m ka m kwụsị ife Chineke.”—Renee, onye dị afọ iri na isii.
Jụọ Nwa Gị Ihe Bụ́ Nsogbu Ya
Olee ihe i chere kpatara nsogbu ahụ nwa gị na-enwe? Ụzọ kacha mma ị ga-esi chọpụta bụ ịjụ nwa gị! Ma, kpachara anya ka mkparịta ụka unu ghara ịghọ arụmụka. Kama nke ahụ, mee ihe a e kwuru na Jems 1:19: “Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” Nwee ndidi mgbe gị na ya na-ekwu okwu. Mgbe gị na ya na-ekwurịta okwu, nwee “ogologo ntachi obi,” gosikwa na i nwere “nkà izi ihe,” otú ahụ ịna-eme mgbe gị na onye na-abụghị onye ezinụlọ gị na-ekwurịta okwu.—2 Timoti 4:2.
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị achọghịzi iso gị aga ịmụ Baịbụl, gbalịa ka ị chọpụta ihe bụ́ iwe ya. Ma nwee ndidi mgbe gị na ya na-ekwurịta ya. Ị gaghị achọpụta ihe bụ́ nsogbu ya ma ọ bụrụ na mkparịta ụka gị na ya agaa otú nke a a kọrọ n’okpuru ebe a si gaa.
Nwa: Achọghịzi m iso unu aga ịmụ Baịbụl.
Nna: [n’olu ike] Ị̀ sị na ị chọghịzi iso anyị?
Nwa: Ike ịga ya agwụla m, ọ naghịzi atọ m ụtọ.
Nna: Ị̀ na-ekwu na ike Chineke agwụla gị? Ị̀ chọrọ ịgwa m na ị chọghịzi ife Chineke? Nke ahụ agaghị eme eme! Ọ bụrụhaala na i bi n’ụlọ a, ị ga-esorịrị anyị ma ị̀ chọrọ ma ị́ chọghị!
Chineke chọrọ ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha banyere ya, chọọkwa ka ụmụ na-erubere ndị mụrụ ha isi. (Ndị Efesọs 6:1) Ma, ị chọghị ka nwa gị soro gị na-aga ịmụ Baịbụl n’ihi na ị manyere ya amanye, kama ị chọrọ ka o jiri obi ya niile na-eso gị n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya.
Ị ga-aka enyere ya aka ma ọ bụrụ na ị chọpụta ihe bụ́ nsogbu ya. Ka nna nwee ike ịchọpụta ihe bụ́ nsogbu nwa ya, lee otú mkparịta ụka ha kwesịrị isi aga.
Nwa: Achọghịzi m iso unu aga ịmụ Baịbụl.
Nna: [n’olu dị nwayọọ] Gịnị mere na ị chọghịzi ịga?
Nwa: Ike ịga ya agwụla m, ọ naghịzi atọ m ụtọ.
Nna: Ama m na mmadụ ịnọ ọdụ otu ebe ruo otu awa ma ọ bụ abụọ nwere ike ịgwụ ike. Ma, gịnị bụ nsogbu ị kacha enwe ebe ahụ?
Nwa: Amaghị m. Naanị ihe m ma bụ na achọghịzi m ịga.
Nna: Ndị enyi gị hà sịrị na ha achọghịzi ịga?
Nwa: Enweghịzi m ndị enyi. Ọ bụ ya bụ nsogbu m! Kemgbe ezigbo enyi m kwapụrụ, ọ dị m ka e nweghịzi onye mụ na ya nwere ike ịkparịta ụka! Ndị ọzọ nwechara ndị enyi, ma enweghị m enyi!
N’ihe atụ a, otú ahụ nna ahụ si kwe ka nwa ya kwuo ihe dị ya n’obi mere ka ọ chọpụta na nsogbu nwa ya bụ na o nweghị ndị enyi. Ihe a nna a mere ga-emekwa ka nwa ahụ nwee ike ịkọrọ ya nsogbu ndị ọzọ ọ na-enwe.—Gụọ igbe bụ́Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtala na ọ bụrụ na ha emerie nsogbu ndị na-eme ka ha ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe, obi na-esikwu ha ike, ife Chineke ga-atọkwu ha ụtọ. Ka anyị weregodị Ramón bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya maa atụ. O kwuru na ụjọ na-atụ ya ime ka ụmụ akwụkwọ ibe ya mara na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ramón mechara chọpụta na ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl esighị ike otú o cheburu, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ na-achị ya ọchị. Ọ sịrị:
“O nwere otu ụbọchị nwa klas anyị nọ na-achị m ọchị n’ihi na m bụ Onyeàmà Jehova. Ezigbo ụjọ jidere m, ma achọpụtara m na ụmụ klas anyị ndị ọzọ na-ege ntị. Ihe m meziri bụ ịgwa ya ka o kwuo ihe ndị a na-akụzi n’okpukpe nke ya. O juru m anya na ụjọ jidedịrị ya karịa m. Mgbe ahụ ka m matara na ọtụtụ ndị na-eto eto ma ihe okpukpe ha na-akụzi, ma ha enweghị ike ịkọwara ya ndị ọzọ. M ka ha mma, n’ihi na enwere m ike ịkọwara mmadụ ihe ndị m kweere. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ụmụ klas anyị kwesịrị imewe ihere ma e kwute okwu okpukpe mmadụ na-ekpe, ọ bụghị mụnwa!”
MEGODỊ IHE A: Ka i nwee ike ịchọpụta ihe dị n’obi nwa gị, jụọ ya ihe o chere banyere ịbụ Onye Kraịst. Jụọ ya ma ò chere na e nwere uru mmadụ ịbụ Onye Kraịst bara? Olee nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara ya? Ò chere na uru ọ ga-abara ya karịrị nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara ya? Gwa ya ka ọ kọwaara gị otú uru ya si karịa nsogbu ya? (Mak 10:29, 30) Nwa gị nwere ike idetu ihe ndị a n’akwụkwọ. Ọ ga-ekewa akwụkwọ ahụ ụzọ abụọ, dee uru ndị ahụ n’aka nri, deekwa ihe ndị bụ́ nsogbu n’aka ekpe. Ide ihe ndị a n’akwụkwọ ga-enyere ya aka ịmata nsogbu ndị ọ na-enwe, ma nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme banyere ha.
‘Ike Iche Echiche’ Nwa Gị
Ndị nne na nna na ndị ọkachamara achọpụtala na e nwere nnọọ ihe dị iche n’otú obere ụmụaka si eche echiche na otú ndị nke totụrụla eto si eche echiche. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Obere ụmụaka na-ekweta ihe a gwara ha ozugbo, ma ndị nke totụrụla eto na-echebara ihe a gwara ha echiche tupu ha ekwere ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịkụziri nwatakịrị na ọ bụ Chineke kere ihe niile. (Jenesis 1:1) Ma, ị gwa nwa totụrụla eto ụdị ihe ahụ, ajụjụ ụfọdụ ga-abata ya n’obi bụ: ‘Olee otú m ga-esi amata na Chineke dị? Ọ̀ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, gịnị mere o ji kwe ka ihe ọjọọ dịrị? Olee otú o si bụrụ na Chineke enweghị mmalite, o nweghị ọgwụgwụ?’—Abụ Ọma 90:2.
I nwere ike iche na ajụjụ ndị a nwa gị na-ajụ gosiri na o nweghịzi okwukwe na Chineke. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-egosi na nwa gị etowela. A sị ka e kwuwe, ịjụ ajụjụ so n’ihe na-enyere mmadụ aka ịghọ Onye Kraịst okwukwe ya siri ike.—Ọrụ 17:2, 3.
Ihe ọzọ bụ na nwa gị amụtawala iji “ike iche echiche” ya eme ihe. (Ndị Rom 12:1, 2) Nke a na-enyere ya aka ịghọta “ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke ihe Ndị Kraịst kweere karịa otú o si ghọta ya mgbe ọ bụ nwata. (Ndị Efesọs 3:18) Ugbu a ka i kwesịdịrị inyere nwa gị aka ka o chebara ihe ndị o kweere echiche, ka okwukwe ya sie ike.—Ilu 14:15; Ọrụ 17:11.
MEGODỊ IHE A: Gị na nwa gị mụgharịa isiokwu ụfọdụ i nwere ike iwere na nwa gị etofeela, unu lebagharịa anya n’ihe ụfọdụ gị na ya na-ewerebu na ha adịghị mkpa. Dị ka ihe atụ, gwa nwa gị ka ọ jụọ onwe ya ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị mere m ji kwenyesie ike na Chineke dị? Olee ihe ndị m na-ahụ, bụ́ ndị na-egosi m na Chineke hụrụ m n’anya? Gịnị mere m ji kwenyesie ike na irube isi n’iwu Chineke baara m uru?’ Kpachara anya ka ị ghara ịmanye nwa gị ka o kweta ihe ndị gịnwa kweere. Kama nke ahụ, nyere ya aka ka ọ ghọta ihe mere o ji kwenye n’ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ọ ghọta ha, ọ ga-aka eme ka okwukwe ya sikwuo ike.
“E Mekwara Ka I Kwere”
Baịbụl kọrọ banyere otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti, onye bidoro mgbe “ọ bụ nwa ọhụrụ” mara ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, Pọl onyeozi gbara Timoti ume, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” (2 Timoti 3:14, 15) O nwere ike ịbụ na i bidoro mgbe nwa gị ka bụ nwa ọhụrụ kụziwere ya Baịbụl otú ahụ a kụziiri Timoti. Ma ugbu a, ọ dị mkpa ka i nyere ya aka ikwere ihe ndị ahụ ị kụziiri ya.
Akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, (Bekee) sịrị: “Ebe ọ bụ na gị na nwa gị na-eto eto ka bi, i kwesịrị ịtụ anya ka o soro unu na-eme ihe gbasara ofufe Chineke. Ma, ihe i kwesịrị iburu n’obi bụ ime ka nwa gị mụta ịhụ Chineke n’anya, ọ bụghị ịmanye ya ka ọ na-erube isi.” Ọ bụrụ na i buru nke ahụ n’obi, ị ga-enyere nwa gị aka ‘isi ike n’okwukwe.’ Ọ ga-ejizi aka ya họrọ ife Chineke, ọ bụghị ife ya maka na ị chọrọ ka o fewe ya. *—1 Pita 5:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 40 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ị ga-esi nyere nwa gị aka, gụọ Ụlọ Nche May 1, 2009, peeji nke 10-12, na akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, (Bekee) peeji nke 315-318.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .
▪ Gịnị ka m na-eme ma ọ bụrụ na nwa m ekwetaghịzi ihe ndị m ji Baịbụl kụziere ya?
▪ Olee otú ihe ndị m gụtara n’isiokwu a ga-esi enyekwuru m aka ma ọ bụrụ na nwa m ekwetaghịzi ihe m kụziiri ya?
[Igbe dị na peeji nke 19]
Hà Na-amanye Ụmụ Ha Amanye?
Ụgha: Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-amanye ụmụ ha ka ha soro ha kpewe okpukpe ha na-ekpe.
Eziokwu: Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-agbalị ịkụziri ụmụ ha ka ha hụ Chineke n’anya n’ihi na Baịbụl nyere ha iwu ime otú ahụ. (Ndị Efesọs 6:4) Ma, ha ghọtara na ọ bụrụ na nwatakịrị etoo, ọ bụzi ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-eso ha kpewe okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụ na ọ gaghị eso ha.—Ndị Rom 14:12; Ndị Galeshia 6:5.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Nweere Ya Ndidi!
I kwesịrị inwe ezigbo ndidi mgbe gị na nwa gị na-akparịta ụka. Ị chọpụta na nwa gị anaghịzi atụ ụjọ ịkọrọ gị nsogbu ya, ọ ga-eme ka ị mara na inwe ndidi bara uru. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii, sịrị: “Mgbe mụ na papa m na-akparịta ụka n’otu abalị, m gwara ya na m nwere ebe mụ na ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet, nwee enyi nwoke. Agwakwara m ya na m chọrọ ịgbapụ n’ụlọ. O nwere nnọọ ndidi mgbe mụ na ya na-ekwurịta ihe ndị ahụ. Amaghị m ma è nwekwara nna ga-amata na nwa ya nwaanyị esusuola enyi ya nwoke ọnụ, na-ezigakwara ya ozi mgbe niile, nna ahụ enwee ndidi mgbe nwa ya na-agwa ya ihe ndị a ma ghara ịbara ya mba. Enwere m ike ịkọrọ papa m ihe ọ bụla. Ama m na ọ chọrọ inyere m aka.”
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ọ Bara Uru Ka Nwa Gị Nwee Onye Ọ Na-eṅomi
Ọ na-abara ndị na-eto eto uru mgbe ụfọdụ ma e nwee onye si n’ezinụlọ ọzọ na-agba ha ume. Ị̀ ma onye na-eme nke ọma n’ofufe Chineke nke nwere ike ịna-agba nwa gị na-eto eto ume? Ọ ga-adị mma ka i mee ka ya na nwa gị na-anọrị. Ihe mere i ji eme ya abụghị ka i leghara ọrụ gị anya. Ma cheta Timoti. O ritere ezigbo uru n’àgwà ọma Pọl onyeozi, Pọl eritekwa ezigbo uru mgbe ya na Timoti so na-eje ozi.—Ndị Filipaị 2:20, 22. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 56 O si n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè Nke 1, (Bekee) nke e bipụtara n’afọ 2011, peeji nke 318. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.