‘A Ga-ekwusa Ozi Ọma Alaeze’
‘A Ga-ekwusa Ozi Ọma Alaeze’
“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—MATIU 24:14.
Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kọrọ na Jizọs “na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Jizọs kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) O zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta dị iche iche. O mechakwara nye ha iwu, sị: ‘Unu ga-abụkwa ndị àmà m ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’—Ọrụ 1:8; Luk 10:1.
Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe Jizọs gwara ha n’egbughị oge. “Kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ndị na-eso ụzọ Jizọs niile kwusara ozi ọma, ha ahapụrụghị ya ụfọdụ ndị ka ha kwusawa. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Neander, kwuru na “Celsus, bụ́ onye mbụ dere akwụkwọ iji kwugide Ndị Kraịst, kwara Ndị Kraịst emo maka na ndị na-akpacha ajị anụ, ndị na-edozi akpụkpọ ụkwụ, ndị na-esiji akpụkpọ anụ, ndị itibọrịbọ na ndị ọ na-enweghị ihe ha bụ socha na-ekwusasi ozi ọma ike.” N’akwụkwọ bụ́ The Early Centuries of the Church, otu nwoke aha ya bụ Jean Bernardi, dere banyere Ndị Kraịst, sị: “A gwara [ha] ka ha gaa kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ebe niile. Ha ga-ekwusa ya n’okporo ụzọ, n’obodo ukwu, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa n’ụlọ ndị mmadụ. Ma ndị mmadụ hà nabatara ha ma hà anabataghị ha. . . . Ha ga-ekwusa ya n’ebe niile n’ụwa.”
N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Otu ụkọchukwu ndị Anglịkan, nke aha ya bụ David Watson, dere, sị: “Otu ihe mere na
ọtụtụ ndị achọghịzi ife Chineke taa bụ na chọọchị ejighị ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe kpọrọ ihe.” Otu nwoke aha ya bụ José Luis Pérez Guadalupe, dere n’akwụkwọ ya bụ́ Why Are the Catholics Leaving? na “chọọchị dị iche iche anaghị aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusa ozi ọma.” Ma, o dere banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ha na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma, ha na-ahazikwa otú ha si ekwusa ya ahazi.”N’akwụkwọ bụ́ Cato Supreme Court Review, 2001-2002, e dere ihe otu nwoke aha ya bụ Jonathan Turley chọpụtara banyere Ndịàmà Jehova. Nwoke ahụ sịrị: “E kwutehaala okwu Ndịàmà Jehova, ihe na-agbatakarị ndị mmadụ n’obi bụ ndị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusa ozi ọma n’oge ndị mmadụ na-achọghị ka ha bịa. Ihe mere Ndịàmà Jehova ji aga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ abụghị naanị ka ndị mmadụ sowe ha, kama ha weere na iwu ji ha ikwusa ozi ọma.”
[Igbe dị na peeji nke 9]
Olee Ndị I Chere Bụ́ Ezigbo Ndị Kraịst?
Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji amata ezigbo Ndị Kraịst, olee ndị i chere na ọ bụ ha na-eme ihe ndị ahụ Kraịst kwuru? Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ puku chọọchị ndị sịrị na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst, cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Matiu 7:21) Ọ bụrụ na mmadụ achọpụta ndị na-eme uche Nna anyị, ya bụ, ndị na-eme ihe ndị ahụ e ji amata ezigbo Ndị Kraịst, ọ bụrụkwa na onye ahụ esoro ha na-efe Chineke, ọ ga-eso ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa. Ọ ga-adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị wetaara gị magazin a, ka ha kọwakwuoro gị ihe Alaeze Chineke bụ na ihe ọ ga-emere ndị mmadụ.—Luk 4:43.