Ihe O Kwuru Dabara n’Ihe Ndị Dọkịta Chọpụtara
Ihe O Kwuru Dabara n’Ihe Ndị Dọkịta Chọpụtara
“Ọ̀ bụ na mụ edeghịrị gị okwu ndụmọdụ na nke ihe ọmụma n’oge gara aga, iji gosi gị izi ezi nke okwu bụ́ eziokwu, ka i wee gaa kọọrọ onye zitere gị okwu bụ́ eziokwu?”—ILU 22:20, 21.
IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Ndị sayensị nke oge a achọpụtala na ọtụtụ ihe e dere n’akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie abụghị eziokwu, ọ bụrụkwa na mmadụ emee ihe ndị ahụ, ọ ga-akpatara ya nsogbu. Ndị na-ede akwụkwọ taa na-edegharịkwa ihe ụfọdụ ha dere ka ha daba n’ihe ọhụrụ ndị sayensị na-achọpụta. Ma Baịbụl sịrị na ọ bụ Onye kere ihe niile kwuru ihe e dere na ya nakwa na Okwu ya “na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.
IHE GOSIRI NA IHE BAỊBỤL KWURU DABARA N’IHE NDỊ DỌKỊTA CHỌPỤTARA: N’iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, a gwara ha na onye chọrọ ịga mposi ga-egwu ala ‘ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu’ ma kpochie nsị ya ma ọ nyụchaa. (Diuterọnọmi 23:12, 13) Iwu ahụ kwukwara na ọ bụrụ na onye Izrel emetụ ozu mmadụ ma ọ bụ ozu anụmanụ aka, ọ ga-eji mmiri saa onwe ya. (Levitikọs 11:27, 28; Ọnụ Ọgụgụ 19:14-16) N’oge ahụ, ọ bụrụ na mmadụ ebute ọrịa ekpenta, a na-akpọpụ ya iche ka ọ ghara ibunye ya ndị ọzọ ruo mgbe a chọpụtara na ọrịa ahụ alaala.—Levitikọs 13:1-8.
IHE NDỊ DỌKỊTA CHỌPỤTARA: A chọpụtala na inwe ebe dị mma a na-aga mposi, ịkwọ aka mgbe niile, na ịkpọpụ ndị na-arịa ọrịa na-efe efe iche ka bụ ụzọ kacha mma e si eme ka ndị mmadụ ghara ibute ọrịa. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Ọrịa n’Amerịka sịrị na ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị ụlọ mposi, ‘ebe ha kwesịrị ịga mposi bụ n’ebe na-adịghị nso ná mmiri. Ha ga-egwu ala, nyụọ nsị ma kpochie ya.’ Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ nwere ebe dị mma ha na-aga mposi ma ghara ịna-anyụ nsị aghara aghara, afọ ọsịsa agaghị na-asakarị ndị mmadụ. N’ihe na-erubeghị narị afọ abụọ gara aga, ndị dọkịta chọpụtara na ha bunyere ọtụtụ ndị ọrịa ọrịa n’ihi na ha akwọghị aka mgbe ha metụchara ozu aka. Ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka igbochi ọrịa kwukwara na ịkwọ aka “bụ ihe kacha mma mmadụ ga-eme ka ọ ghara ibute ọrịa.” Oleekwanụ maka ihe ahụ Chineke gwara ụmụ Izrel, nke bụ́ ka ha na-akpọpụ onye ekpenta iche ma ọ bụ onye na-arịa ụdị ọrịa ọzọ na-efe efe? N’oge na-adịbeghị anya, otu akwụkwọ nke na-akọ maka ahụ́ ike kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọrịa na-efe efe amalite ịrịa ndị mmadụ n’obodo, otú kacha mma e nwere ike isi mee ka ndị ọzọ ghara ibute ya bụ ịkpọpụ ndị ahụ na-arịa ọrịa iche.”
GỊNỊ KA I CHERE? N’akwụkwọ niile e weere na ha bụ akwụkwọ dị nsọ, bụ́ ndị e dere n’oge ochie, è nwere nke kwuru ihe dabara n’ihe ndị dọkịta nke oge a chọpụtara? Ka ì chere na Baịbụl dị iche?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“O nweghị onye gụrụ iwu Chineke nyere ụmụ Izrel banyere otú ha ga-esi na-edewe onwe ha ọcha nke na-agaghị ekweta na iwu ndị ahụ enweghị atụ.”—AKWỤKWỌ BỤ́ MANUAL OF TROPICAL MEDICINE, NKE NDỊ DỌKỊTA BỤ́ ALDO CASTELLANI NA ALBERT J. CHALMERS DERE