Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee otú e si ezipụ akwụkwọ ozi n’oge Baịbụl?
▪ N’oge ochie, ndị ọchịchị Peshia nwere ndị ha na-enye akwụkwọ ozi ọ bụla ha dere ma ọ bụ ozi ọ bụla ha nwere ka ha gaa wega ha ma ọ bụ ziga ha n’ebe ọ bụla a chọrọ. Akwụkwọ Esta kọwara otú ndị Peshia si ezipụ ozi ndị ahụ. O kwuru, sị: “[Mọdekaị] wee dee ihe n’aha Eze Ahazuirọs, jirikwa mgbaaka eze e ji aka ihe akara kaa ya akara wee zipụ akwụkwọ ozi ahụ site n’aka ndị na-ebu ozi bụ́ ndị na-eji ịnyịnya aga ozi, ndị na-agba ịnyịnya ndị e ji aga ozi eze, bụ́ ụmụ nne ịnyịnya ndị na-awụ ọsọ.” (Esta 8:10) Ndị Rom oge ochie nwekwara ndị ndị ọchịchị ha na ndị agha ha na-enye akwụkwọ ozi ma ọ bụ ozi ọ bụla ọzọ ka ha gaa wega ha ma ọ bụ ziga ha n’ebe ọ bụla a chọrọ.
Ọ bụghị ndị ahụ na-ezipụrụ ndị ọchịchị ozi na-ezipụkwara ndị nkịtị akwụkwọ ozi ha, dị ka akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere. Ọ bụrụ na mmadụ bara ọgaranya, o nwere ike idunye ohu ya ka ọ gaa wegara ya akwụkwọ ozi n’ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ma, ọtụtụ ndị na-ewere akwụkwọ ozi ha nye ndị ha ma ama ma ọ bụdị ndị ha na-amaghị ama, bụ́ ndị na-aga ebe ha chọrọ iziga akwụkwọ ozi ha, ka ha nye ya ndị ha degaara ya. Mmadụ nwere ike inye ndị ezinụlọ ya, ndị enyi ya, ndị agha, ma ọ bụ ndị ahịa akwụkwọ ozi ka ha wegara ya ndị ọ chọrọ inye ya. Ma ebe nsogbu dịzi bụ ma onye e nyere akwụkwọ ozi ọ̀ bụkwa ezigbo mmadụ ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-ewere ya otú ọ natara ya nye onye e degaara ya. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o nwere ike ịbụ na Pọl nyere Ndị Kraịst ibe ya na-eme njem akwụkwọ ozi ụfọdụ o dere ka ha were ha nye ndị o degaara ha.—Ndị Efesọs 6:21, 22; Ndị Kọlọsi 4:7.
Olee otú e si azụ ahịa n’Izrel oge ochie?
▪ N’Izrel oge ochie, otú e si akpata akụ̀ bụ ịrụ ọrụ ubi, ịzụ anụ ụlọ, na iji ngwá ahịa agbanweta ngwá ahịa ọzọ. Baịbụl kwuru na ụmụ Izrel na-azụ ahịa n’ọnụ ụzọ ámá ndị e nwere n’obodo ha, dị ka “Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ,” “Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,” na ‘Ọnụ Ụzọ Ámá Ibe Eju.’ (Nehemaya 3:1, 3; Jeremaya 19:2) O yiri ka ọ̀ bụ ngwá ahịa a na-ere n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ ka e si nweta aha ọnụ ụzọ ámá nke ọ bụla. Akwụkwọ Nsọ kwukwara na e nwere ‘okporo ámá nke ndị na-eme achịcha,’ nweekwa okporo ámá ebe ndị a na-emepụta ihe ndị ọzọ a na-ere ere.—Jeremaya 37:21.
Ego ole ka a na-ere ngwá ahịa n’oge ahụ? Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “N’ime ọtụtụ narị afọ gara aga, ego ole a na-ere ngwá ahịa na-agbanwe agbanwe, ya dịtụ oké ọnụ, ya adịtụ ọnụ ala. O sikwara ike ịmata ego ole a na-ere ngwá ahịa nke ọ bụla n’otu ebe n’oge ndị ahụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndị e dere n’oge ochie, ma ndị nke e dere na Baịbụl, gosiri na e nwere mgbe ọnụ ngwá ahịa na-arị elu ọjị. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, a na-ere ndị ohu ere. E rere Josef mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ. Ọ ga-abụ na mkpụrụ ego ahụ bụ shekel. Ego ole a e rere Josef bụ ihe a na-ere otu ohu n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ asaa gara aga. (Jenesis 37:28) Mgbe narị afọ atọ gafere, ihe a na-erezi otu ohu bụ shekel iri atọ. (Ọpụpụ 21:32) Mgbe ihe dị ka otu puku afọ gafere, ihe a na-ere otu ohu bụ shekel iri ise. (2 Ndị Eze 15:20) Mgbe narị afọ abụọ ọzọ gafere, n’oge ndị Peshia na-achị ụwa, a bịaziri na-ere otu ohu shekel iri itoolu ma ọ bụ karịa. O doro anya na ọ bụghị n’oge anyị a ka ngwá ahịa malitere ịrị elu.
[Okwu nkọwa dị na peeji nke 22]
Onye ndị ọchịchị Peshia na-enye akwụkwọ ozi ka o wega ebe ha chọrọ
[Okwu nkọwa dị na peeji nke 22]
Ihe a tụrụ atụ nke gosiri ebe a na-ere mkpụrụ osisi
[Ebe E Si Nweta Foto]
© DeA Picture Library / Art Resource, NY