“Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Gị?”
Bịaruo Chineke Nso
“Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Gị?”
GỊNỊ ka Jehova chọrọ n’aka ndị chọrọ ife ya otú dị ya mma? Ọ̀ chọrọ ka anyị na-akpa àgwà ka ndị zuru okè nke bụ́kwanụ ihe anyị na-agaghị emeli ebe ọ bụ na anyị ezughị okè? Ka ihe Jehova chọrọ n’aka anyị ọ̀ bụ ihe ndị anyị ga-emeli? Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ndị a n’ihi na ịmata ha ga-eme ka ife Chineke na-atọ anyị ụtọ. Ka anyị leba anya n’ihe ndị Maịka onye amụma kwuru na Chineke chọrọ n’aka anyị.—Gụọ Maịka 6:8.
“Ọ gwawo gị ihe dị mma.” Anyị ekwesịghị ichewe ihe ndị Chineke chọrọ n’aka anyị echewe. Ọ gwala anyị ha họọ haa na Baịbụl. Ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị bụ “ihe dị mma.” O nwekwanụghị mgbe ọ ga-agwa anyị mee ihe na-adịghị mma. “Chineke bụ ịhụnanya,” n’ihi ya, ọ bụ ihe ndị ga-abara anyị uru ka ọ chọrọ ka anyị na-eme. (1 Jọn 4:8; 5:3) Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, obi ga-atọ ya ụtọ, irubere ya isi ga-abakwara anyị uru.—Diuterọnọmi 10:12, 13.
“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị?” Ò kwesịrị ekwesị ka Chineke chọọ ka anyị na-erubere ya isi? Eenụ, o kwesịrị ekwesị! Anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, ọ bụkwa ya ji anyị ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ebe ọ dị otú ahụ, olee ihe Chineke chọrọ n’aka anyị? Maịka kwuru ụzọ ihe atọ Chineke chọrọ n’aka anyị. Nke mbụ na nke abụọ bụ otú anyị ga-esi na-akpaso mmadụ ibe anyị àgwà, ebe nke atọ bụ ihe anyị ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma.
“Ime ihe n’ikpe ziri ezi.” Otu akwụkwọ kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “ikpe ziri ezi” n’asụsụ Igbo pụtara “ndị mmadụ imeso ibe ha ihe otú dị mma na otú kwesịrị ekwesị n’obodo.” Chineke gwara anyị ka anyị na-emeso ndị ọzọ ihe otú yanwa chọrọ ka anyị na-emeso ha. Anyị ga-egosi na anyị na-eme ihe n’ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe ma ghara ịna-emelara ụfọdụ ndị ihe. (Levitikọs 19:15; Aịzaya 1:17; Ndị Hibru 13:18) Ọ bụrụ na anyị ana-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma, o nwere ike imetụ ha n’obi, ha emesookwa anyị ihe otú dị mma.—Matiu 7:12.
“Ịhụ obiọma n’anya.” Ihe Chineke gwara anyị abụghị naanị ka anyị nwee obiọma, kama ọ chọkwara ka anyị hụ obiọma n’anya. Okwu Hibru bụ́ cheʹsedh, bụ́ nke a sụgharịrị “obiọma,” nwekwara otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ya. E nwere ike ịsụgharị ya “ịhụnanya na-adịgide adịgide.” Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ asụgharịa okwu Hibru ahụ ịhụnanya ma ọ bụ ebere ma ọ bụ obiọma, onye ahụ asụgharịtaghị ya. O nweghị otu n’ime ha naanị ya bụ cheʹsedh, kama ọ bụ ha atọ bụ cheʹsedh.” Ọ bụrụ na anyị hụrụ obiọma n’anya, anyị agaghị eche ka a gwa anyị agwa tupu anyị emeere ndị ọzọ ihe ọma. Kama nke ahụ, inyere ndị nọ ná nsogbu aka ga na-atọ anyị ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga-enweta obi ụtọ mmadụ na-enweta ma o nye ndị ọzọ ihe.—Ọrụ Ndịozi 20:35.
“Iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.” Na Baịbụl, okwu bụ́ “ije ije” pụtara “ime ihe.” E nwere ike ikwu na anyị na Chineke so na-eje ije ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Chineke kwuru na Baịbụl. Ọ dị mkpa ka anyị ‘jiri obi umeala’ na-ebi ndụ otú ọ chọrọ. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị dị obi umeala n’anya Chineke, anyị ga-aghọta na anyị bụ mmadụ efu na-eme mmehie, ghọtakwa na e nwere ọtụtụ ihe ndị anyị na-agaghị emeli. N’ihi ya, ‘iji obi umeala soro Chineke na-eje ije’ pụtara na anyị ga-aghọta ihe Chineke chọrọ n’aka anyị, ghọtakwa ihe ndị anyị ga-emeli. N’eziokwu, ihe Jehova chọrọ n’aka anyị abụghị ihe anyị na-agaghị emeli.
Ọ bụrụ na anyị ji ike anyị niile na-efe Jehova, obi ga-atọ ya ụtọ. (Ndị Kọlọsi 3:23) Ọ maara ihe ndị anyị na-agaghị emeli. (Abụ Ọma 103:14) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ekweta na e nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Nke ahụ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ na anyị so Chineke na-eje ije. Ọ ga-adị mma ka ị mụta otú ị ga-esi malite iso Chineke na-eje ije. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu.—Ilu 10:22.
Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Nọvemba: