Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Jizọs ọ̀ ghara ụgha mgbe o kwuru na nnu nwere ike ịkwụsị ịtọ ụtọ?

Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, ọ gwara ha, sị: “Unu bụ nnu nke ụwa; ma ọ bụrụ na nnu adịkwaghị atọ ụtọ, olee otú a ga-esi mee ka ọ dịghachi ụtọ? A pụkwaghị iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.” (Matiu 5:13) A na-eji nnu eme ka nri ghara imebi. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ka ha ghara imebi omume ọma ha nakwa ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma.

O nwere ihe akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru banyere ihe ahụ Jizọs kwuru gbasara nnu. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Nnu a na-enweta n’akụkụ osimiri a na-akpọ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ nwere ụmụ irighiri ihe na-adị n’ime ya bụ́ ndị na-eme ka nnu a ghara ịbụcha ezigbo nnu. Ọ bụrụ na mmiri emesa nnu a, nke bụ́ ezigbo nnu nwere ike ịpụcha, ihe ga-afọdụ abụrụzie ụmụ irighiri ihe ndị na-abụghị nnu.” Ọ bụ ihe ndị ahụ na-afọdụzi e chere na ha bụ́ nnu mgbe nke bụ́ ezigbo nnu pụchara ka Jizọs na-ekwu na ‘a pụghị iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí.’ Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “N’agbanyeghị na ụmụ irighiri ihe ndị ahụ na-adị ná nnu a na-enweta n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ na-eme ka nnu a ghara ịdị mma ka nnu ndị a na-enweta n’osimiri ndị ọzọ, ọ bụ n’oké osimiri ahụ ka ndị Izrel na mba ndị gbara ha gburugburu na-agakarị enweta nnu. Ihe kpatara ya bụ na ọ naghị esiri ha ike inweta nnu n’ebe ahụ n’ihi na ha nwere ike ikpota nnu n’ụsọ oké osimiri ahụ.”

Mgbe Jizọs tụrụ ilu banyere otu nwaanyị nke mkpụrụ ego drakma funahụrụ, gịnị ka ndị mmadụ ghọtara funahụrụ nwaanyị ahụ?

N’otu ilu Jizọs tụrụ, o kwuru na mgbe otu mkpụrụ ego drakma funahụrụ otu nwaanyị nke nwere mkpụrụ ego drakma iri, nwaanyị ahụ mụnyere oriọna ya ma zachaa ụlọ ya nke ọma ruo mgbe ọ chọtara mkpụrụ ego ahụ. (Luk 15:8-10) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, otu mkpụrụ ego drakma bụ ihe e nwere ike ịkwụ mmadụ n’ọrụ ụbọchị. N’ihi ya, ego funahụrụ nwaanyị ahụ bụ nnukwu ego. Ma, ihe nwaanyị ahụ mere n’ilu Jizọs tụrụ bụ ihe na-eme eme n’oge ahụ.

Ihe e kwuru n’akwụkwọ ụfọdụ e ji eme nnyocha gosiri na ụmụ nwaanyị na-ejikarị mkpụrụ ego achọ ụlọ ha mma. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na mkpụrụ ego ahụ Jizọs kwuru okwu ya so n’ihe ochie nwaanyị ahụ nwetara n’ezinụlọ nne na nna ya. O nwekwara ike iso n’ihe e nyere di nwaanyị ahụ mgbe nwaanyị ahụ lụrụ di. Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na nwaanyị ahụ mere ihe niile o nwere ike ime ka ọ chọta mkpụrụ ego ahụ funahụrụ ya.

Ihe ọzọ bụ na n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ụlọ ndị ogbenye na-ekpokarị ọkụ, na-agbakwa ọchịchịrị n’ihi otú e si rụọ ha. Ụfọdụ na-enwe windo ole na ole, ụfọdụ anaghịdị enwe enwe. Ha na-awụsakarịkwa ahịhịa ma ọ bụ okporo ahịhịa dị iche iche kpọrọ nkụ n’ala ụlọ ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na mkpụrụ ego adaa n’ala, ọ na-esi ike ịchọta. Ọ bụ ya mere otu ọkà mmụta ji kwuo na “otú a na-esikarị achọta ihe n’ụdị ụlọ a ma obere ihe dapụ n’ala bụ ịmụnye ọkụ ma zaa ụlọ ahụ nke ọma.”

[Foto dị na peeji nke 21]

Nnu dị n’ụsọ Oké Osimiri nwụrụ anwụ

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Mkpụrụ ego drakma