Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ndị Ezinụlọ Ji Anọrị

Oge Ndị Ezinụlọ Ji Anọrị

Oge Ndị Ezinụlọ Ji Anọrị

“Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!”—ABỤ ỌMA 133:1.

Ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas.

Ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Jekọb, ma ọ bụ Izrel, mụrụ ndị Izrel niile. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ndị Izrel niile bụ “ụmụnne,” ya bụ, na ha si n’otu ezinụlọ. Ndị Izrel na-ezukọta na Jeruselem maka ememme dị iche iche ha na-eme. Ememme ndị ahụ ‘na-adị ha mma,’ ọ ‘na-enyekwa ha obi ụtọ.’ Ọ na-agụkwa ọtụtụ ezinụlọ n’oge a agụụ ka oge Krismas ruwe eruwe ka ha na ndị ezinụlọ ha nọrịa ma nwee obi ụtọ.

Gịnị mere ụfọdụ ezinụlọ anaghị enwe obi ụtọ n’oge Krismas?

Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Christmas and New Year’s Celebrations kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, ụmụ obere nsogbu ọtụtụ ezinụlọ na-enwe n’oge ndị ọzọ n’afọ na-aka njọ ma ha niile lọta n’oge Krismas.”

Otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.

‘Na-akwụ ndị mụrụ gị na ndị nne na nna gị ochie ụgwọ ruuru ha.’ (1 Timoti 5:4) Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị mee, gị na ndị ezinụlọ gị gaa leta ndị ikwu unu ugboro ugboro n’afọ. Ọ bụrụ na ebe ndị ikwu gị bi dị ezigbo anya n’ebe unu bi, gị na ha ka nwere ike ịna-ekwurịta okwu mgbe niile. I nwekwara ike ịna-edegara ha akwụkwọ ozi, na-akpọ ha na fon, ma ọ bụ jiri iimel na-ezigara ha ozi. Ọ bụrụ na gị na ha ana-ekwurịta okwu mgbe niile, ọ ga-eme ka unu ghara ịna-esekarị okwu.

“Unu enweghị ohere maka igosi obi ọmịiko. . . . Megheenụ obi unu.” (2 Ndị Kọrịnt 6:12, 13) Ọ bụrụ na gị na ndị ikwu unu na-ahụ naanị otu ugboro n’afọ, ọ ga-adịzi gị ka hà abụghị ndị ikwu unu. Ndị ọ ga-akacha adị otú ahụ bụ ụmụ gị. Ọ na-adị ụfọdụ ụmụaka ka ọ̀ bụ na o nweghị ihe jikọrọ ha na nne na nna ha ochie ma ọ bụkwanụ ndị ikwu ha. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka ị gwa ụmụ gị ka ha ‘meghee obi ha’ ma na-aga eletakwa ndị ikwu unu merela agadi. * Ụmụaka ndị ha na ndị merela agadi na-anọ mgbe niile na-enwe ọmịiko karịa ụmụaka ndị ọzọ. Ha na-asọpụkwara ndị tọrọ ha karịa ụmụaka ndị ọzọ.

“Leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma.” (Ilu 15:23) Olee ihe i nwere ike ime ka ụmụ obere nsogbu unu nwere ghara ịghọ nnukwu nsogbu n’ezinụlọ unu? Otu n’ime ha bụ iwepụta ‘oge kwesịrị ekwesị’ unu ga-eji kwurịta banyere nsogbu ndị ahụ. Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ unu na-ekwurịta okwu mgbe niile, ọ ga-adịrị gị mfe ịgakwuru ha ka unu dozie nsogbu ọ bụla unu nwere. Nke a ga-emekwa ka obi tọọ unu ụtọ mgbe ọ bụla unu chọrọ ịnọrị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Gụọ isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị Ka M Ji Kwesị Ịma Nne na Nna M Ochie” nke gbara na Teta! May 8, 2001, nakwa isiokwu bụ́ “Olee Otú M Pụrụ Isi Kpakwuo Nne na Nna M Ochie Nso?” nke gbara na Teta! June 8, 2001. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.