Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị mere e ji akpọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Ọ bụ Chineke kere ihe niile, n’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka o nwee nwunye nke ga-amụtara ya ụmụ. Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike ịna-akpa àgwà ka ya. Ọ bụ ya mere e ji akpọ Adam, bụ́ mmadụ mbụ o kere, “nwa Chineke.” Jizọs bụkwa nwa Chineke n’ihi na Nna ya, bụ́ Chineke, kere ya ka ọ na-akpa àgwà ka ya. Ma ebe ọ bụ ya bụ onye mbụ Chineke kere, a na-akpọ ya “Ọkpara Chineke.”—Gụọ Luk 3:38; Jọn 1:14, 49.

Olee mgbe Chineke kere Jizọs?

Chineke bu ụzọ kee Jizọs tupu ya ekee Adam. N’eziokwu, Chineke kere Jizọs, sizie n’aka Jizọs kee ihe niile ọzọ, ma ndị mmụọ ozi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ Jizọs “onye [Chineke] bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.”—Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

Jizọs biri n’eluigwe tupu a mụọ ya na Betlehem. Ọ bụ mmụọ n’oge ahụ o bi n’eluigwe. Mgbe oge ruru ka ọ bịa n’ụwa, Chineke bufere ndụ ya n’akpa nwa otu nwaanyị aha ya bụ Meri, e wee mụọ ya n’ụwa, ya abụrụ mmadụ.—Gụọ Luk 1:30-32; Jọn 6:38; 8:23.

Gịnị mere Chineke ji mee ka a mụọ Jizọs n’ụwa? Olee ọrụ dị mkpa Jizọs rụrụ n’ụwa? Baịbụl zara ajụjụ ndị a. Ihe ọ zara ga-eme ka obi dị gị ụtọ, meekwa ka ị ghọtakwuo ihe Chineke na Jizọs meere anyị.