ISIOKWU ỤLỌ NCHE A
Mmadụ Ikiri Ndị Gba Ọtọ Ò Nwere Ihe O Mere?
N’ebe niile n’ụwa, e nwere ọtụtụ akwụkwọ, vidio, na foto ndị na-egosi ndị gba ọtọ. * E nwekwara egwú ndị na-ekwu gbasara ndị gba ọtọ. A na-ekiri ndị gba ọtọ na kọmputa, n’ekwentị, televishọn, nakwa n’ebe ndị mmadụ na-edebe foto ha n’Ịntanet. A na-egosikwa ndị gba ọtọ mgbe a na-akpọsa ngwá ahịa na mgbe a na-egosi ejiji ndị na-ewu ewu. Ọtụtụ ndị taa na-ekirizi ndị gba ọtọ. Ndị na-ekiri ndị gba ọtọ adịla ọtụtụ ugbu a karịa ndị kiriri ya n’oge gara aga.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Gosiri na Ọtụtụ Ndị Na-ekiri Ndị Gba Ọtọ.”
Ndị gba ọtọ ndị mmadụ na-ekiri ugbu a dị iche n’ụdị nke ha na-ekiribu. Otu ọkachamara aha ya bụ Gail Dines dere, sị: “Ndị gba ọtọ a na-egosi n’oge a ajọgbuola onwe ha nke na onye ukwu na onye nta na-ekirizi ụdị nke ndị mmadụ na-asọ asọ n’oge gara aga.”
Olee otú obi dị gị ugbu a a na-egosi ndị gba ọtọ n’ebe dị iche iche? Ì chere na mmadụ ikiri ndị gba ọtọ enwetụdịghị ihe o mere, ka ì chere na o nwechaghị ihe o mere? Ka ị̀ ga-asị na ọ jọgburu onwe ya? Jizọs sịrị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.” (Matiu 7:17) Olee nsogbu ndị mmadụ na-enwe n’ihi ikiri ndị gba ọtọ? Ka anyị nwee ike ịmata azịza nke ajụjụ a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gbasara ikiri ndị gba ọtọ.
Olee nsogbu ikiri ndị gba ọtọ na-akpatara ndị na-ekiri ya?
IHE NDỊ ỌKACHAMARA KWURU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na ndị dọkịta kwudịrị na ọ na-eri mmadụ ahụ́ otú ahụ ọgwụ ọjọọ a na-akpọ koken na-eme.
E nwere otu nwoke aha ya bụ Brian. * Nwoke a na-ekirikarị ndị gba ọtọ n’Ịntanet. Ọ sịrị: “Mbọ niile m gbara ka m kwụsị ya enweghị isi. Ọ na-adị m ka m̀ mụ anya na-arọ nrọ. M na-efufegide isi ruo mgbe isi wawara m. M gbalịrị ka m kwụsị ya, ma mgbe ọtụtụ afọ gachara, m ka na-ekirikwa ya.”
Ndị na-ekiri ndị gba ọtọ anaghị achọ ka ndị mmadụ mata na ọ bụ ihe ha na-eme. Ha na-ezo ya ezo ma na-emegharị ndị ọzọ anya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na ike ụwa na-agwụkarị ha, ha na-ewekarịkwa iwe ma na-achọkarị ịnọrọ onwe ha. Ihe ọzọ bụ na ihere onwe ha na-emekarị ha, ha na-echegbukwa onwe ha. Mgbe ụfọdụ, ha na-achọdị igbu onwe ha. O nwere otu nwoke aha ya bụ Serge. Ọ na-esi n’Ịntanet etinye ndị gba ọtọ n’ekwentị ya ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla. Ọ sịrị: “M na-anọkarị otu ebe naanị m ka onye ike ụwa gwụrụ, na-eche ụwa m. Obi m na-ama m ikpe mgbe niile, ọ na-adịkwa m ka o nweghị uru m bara. Ọ na-adịkwa m ka m̀ tọrọ atọ. Ihere na ụjọ ekweghị m kọsara onye ọzọ nsogbu m.”
Ọ bụrụgodị na mmadụ amaghị ụma hụpere ndị gba ọtọ, ọ ka nwekwara ike ịkpatara ya nsogbu. Mgbe otu ọkachamara aha ya bụ Judith Reisman na-agwa ndị omeiwu mba Amerịka ihe ọ chọpụtara banyere ikiri ndị gba ọtọ, ọ sịrị: “Ọ na-abụ mmadụ kirie ndị gba ọtọ, ihe o kiriri na-abanye ya n’ụbụrụ ma kpaghasịa ya ụbụrụ. Ọ ga-esikwara ya ezigbo ike iwepụ ya n’obi ya.” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Susan amaghị ụma hụpere ndị gba ọtọ n’Ịntanet. Ọ sịrị: “Ihe ahụ m hụpeere ekweghị apụ m apụ n’obi. Ọ na-abụ m nọtụ, mụ echeta ya. Ọ na-adị m ka o nweghị mgbe ọ ga-apụcha m n’obi.”
NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eri mmadụ ahụ́, ọ na-akpatakwara ndị na-ekiri ya ọtụtụ nsogbu.—2 Pita 2:19.
Olee nsogbu onye na-ekiri ndị gba ọtọ na-akpatara ndị ezinụlọ ya?
IHE NDỊ ỌKACHAMARA KWURU: “Ikiri ndị gba ọtọ na-ekewa di na nwunye ma na-etisa ezinụlọ.”—Akwụkwọ bụ́ The Porn Trap, nke Wendy na Larry Maltz dere.
Ikiri ndị gba ọtọ na-emebiri di na nwunye ihe, na-emebikwara ndị ezinụlọ ha ihe n’ihi na
Ọ na-eme ka di na nwunye ghara ịtụkwasị ibe ha obi, na-emekwa ka ha ghara ịhụ ibe ha n’anya.—Ilu 2:12-17.
Ọ na-eme ka di ma ọ bụ nwunye na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru, meekwa ka ọ ghara ịchọ ịma gbasara nwunye ya ma ọ bụ di ya. Ọ na-emekwa ka di ma ọ bụ nwunye mmadụ ghara izuru ya.—Ndị Efesọs 5:28, 29.
Ọ na-eme ka agụụ mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị na-agụ mmadụ.—2 Pita 2:14.
Ọ na-eme ka ndị na-ekiri ya na-achọ ka ha na nwunye ha ma ọ bụ di ha nwee ụdị mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị.—Ndị Efesọs 5:3, 4.
Ọ na-eme ka obi mmadụ pụọ n’ebe nwunye ya ma ọ bụ di ya nọ. Ọ na-emekwa ka onye ahụ kwaa iko.—Matiu 5:28.
Baịbụl gwara ndị lụrụ di na nwunye ka ha ghara ‘ịghọ ibe ha aghụghọ.’ (Malakaị 2:16) Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị akwaa iko, ọ ghọọla nwunye ya ma ọ bụ di ya aghụghọ. Nke a nwere ike ime ka ha kewaa ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm. Ọ bụrụ na ha agbaa alụkwaghịm, ọ ga-akpatara ụmụ ha nsogbu.
Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ na-ekiri ndị gba ọtọ, o nwere ike ịkpa ụmụ ha aka ọjọọ. Brian ahụ anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri, m hụrụ magazin e sere ndị gba ọtọ papa m na-ekiri. M hụrụ ya n’oge m na-egwuri egwu n’ụlọ. M bidoziri ikiri ya na nzuzo, amakwanụghị m ihe mere m ji na-ekiri ya. Otú ahụ ka m si kiriwezie ndị gba ọtọ ruo mgbe m ghọrọ dimkpa.” Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụrụ na ụmụaka amalite ikiri ndị gba ọtọ, ọ ga-eme ka ha malite ịkwa iko mgbe ha ka dị obere, meekwa ka ara ịkwa iko na-agba ha. Ọ ga-emekwa ka uche ghara ịkpakọ ha ọnụ.
NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na ibe ya ghara ịdịkwa ná mma. Ọ na-akpatakwara mmadụ obi mgbawa.—Ilu 6:27.
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ikiri ndị gba ọtọ?
IHE BAỊBỤL KWURU: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—Ndị Kọlọsi 3:5.
N’eziokwu, Jehova * Chineke kpọrọ mmadụ ikiri ndị gba ọtọ asị. Nke a apụtaghị na ọ chọghị iji ntị anụ gbasara mmekọahụ. Ọ bụ ya kere ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ihe mere o ji kee ya bụ ka di na nwunye jiri ya na-eme ibe ha obi ụtọ ma dịrị ná mma. Ọ ga-emekwa ka ha nwee ike ịmụ ụmụ.—Jems 1:17.
Gịnị mere anyị ji kwuo hoo haa na Jehova kpọrọ mmadụ ikiri ndị gba ọtọ asị? Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole kpatara ya.
Jehova ma na ikiri ndị gba ọtọ nwere ike ime ka ndụ mmadụ ghara ịba uru.—Ndị Efesọs 4:17-19.
Ọ hụrụ anyị n’anya, ọ chọghịkwa ka ihe ọ bụla mee anyị.—Aịzaya 48:17, 18.
Jehova achọghị ka e nwee ihe ga-ekewa di na nwunye ma ọ bụ tisaa ezinụlọ.—Matiu 19:4-6.
Ọ chọrọ ka anyị na-akpa àgwà ọma ma na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù.—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-6.
Ọ chọghị ka anyị jiri ihe anyị ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-eme ihe iberiibe.—Ndị Hibru 13:4.
Jehova ma na ndị na-ekiri ndị gba ọtọ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru otú Setan na-eme. Ha na-ewerekwa mmekọahụ otú Setan si were ya.—Jenesis 6:2; Jud 6, 7.
NKE BỤ́ EZIOKWU: Ikiri ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma.—Ndị Rom 1:24.
Jehova na-emetara ndị ikiri ndị gba ọtọ riri ahụ́ ebere, bụ́ ndị chọrọ ịkwụsị ya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị ebere, na-emekwa amara, ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:8, 14) Ọ na-agwa ndị dị umeala n’obi ka ha bịakwute ya ka ‘o wee meere ha ebere, ha enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị.’—Ndị Hibru 4:16; gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Ga-enyere Mmadụ Aka Ịkwụsị Ikiri Ndị Gba Ọtọ.”
E nweela ọtụtụ ndị Chineke nyeere aka, ha akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Aka Chineke nyeere ha ọ̀ baara ha uru? Legodị ihe Baịbụl kwuru gbasara ụfọdụ ndị kwụsịrị ihe ọjọọ ha na-eme: ‘Ma a sachawo unu, e dowo unu nsọ, a kpọwo unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:11) Ha nweziri ike ikwu ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
Susan, bụ́ onye kwụsịrị ikiri ndị gba ọtọ, sịrị: “Ọ bụ naanị Jehova bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ kwụsị ikiri ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na ị rịọ ya ka o nyere gị aka, ọ ga-enyere gị aka, gị na ya adịrị ná mma. Ọ gaghị ajụ inyere gị aka.”
^ para. 3 E kwuwe gbasara ikiri ndị gba ọtọ, ihe a na-ekwu abụghị naanị ndị gba ọtọ e sere ese ma ọ bụ ndị nke a na-egosi na tiivi. Ọ pụtakwara ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ikiri ekiri ma ọ bụ igere egere ma ọ bụ ịgụ n’akwụkwọ nke nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa ya.
^ para. 8 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ para. 25 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.