NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .
Ònye Kere Chineke?
Weregodị ya na ị na-ahụ ebe otu nna na nwa ya nwoke dị afọ asaa na-akparịta ụka. Nna ahụ sịrị nwa ya: “Ogologo oge gara aga, Chineke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya. O kekwara anyanwụ, ọnwa, na kpakpando.” Nwa ahụ chebaara ihe a nna ya gwara ya echiche, jụzie ya, sị: “Papa, ònye kere Chineke?”
Nna ya gwara ya, sị: “E keghị Chineke eke. Chineke enweghị mmalite.” Ihe a nna ya zara ya juru ya afọ. Ma ka nwa ahụ na-eto, ọ ga na-echebakwuru ihe ahụ nna ya zara ya echiche, chọzie ka e mee ka o dokwuo ya anya. O siiri ya ike ịghọta otú o si bụrụ na Chineke enweghị mmalite ebe ọ bụkwanụ na eluigwe na ụwa nwere mmalite. Nwa ahụ nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee ebe Chineke si pụta?’
Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a? Ihe o kwuru adịghị iche n’ihe nna ahụ anyị ji mee ihe atụ gwara nwa ya. Mozis dere, sị: “Jehova, . . . tupu a mụọ ugwu dị iche iche, ma ọ bụ, tupu ị mụpụta ụwa na elu ala, . . . ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, ị bụ Chineke.” (Abụ Ọma 90:1, 2) Aịzaya onye amụma kwukwara ihe yiri ya. Ọ sịrị: “Ị̀ matabeghị, ka ọ̀ bụ na ị nụbeghị? Jehova, bụ́ Onye kere nsọtụ niile nke ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 40:28) Akwụkwọ ozi Jud dere kwukwara na ọ bụ “site na mgbe niile ebighị ebi gara aga” ka Chineke dị.—Jud 25.
Ihe ndị a Baịbụl kwuru gosiri na ihe Pọl onyeozi kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị na Chineke bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Timoti 1:17) Ihe ọ pụtara bụ na o nweghị mgbe Chineke na-adịghị, mgbe ọ bụla ọ sọrọ anyị chee n’echiche. Ọ ga-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 1:8) A gụwa ihe ndị mere Chineke ji bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, otu ihe a ga-agụnyerịrị bụ na ọ na-adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.
Gịnị mere o ji esiri anyị ike ịghọta na Chineke enweghị mmalite, o nweghị ọgwụgwụ? Ọ bụ maka na anyị anaghị adịte ndụ aka. N’ihi ya, ihe anyị ma gbasara oge dị ntakịrị. Ma ebe ọ bụ na Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, otu puku afọ dị ya ka otu ụbọchị. (2 Pita 3:8) Dị ka ihe atụ, ụkpara ọ̀ ga-aghọta ihe bụ́ afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ anyị na-adịru ndụ ebe ọ bụ na o tochahaala, ọ na-anọ naanị ihe dị ka ụbọchị iri ise nwụọ? Mba! Baịbụl kwuru na anyị dị ka ụkpara n’anya Onye Ukwu kere anyị, ọgụgụ isi anyị enweghịkwa ebe o ruru nke ya. (Aịzaya 40:22; 55:8, 9) Ọ bụ ya mere na o kwesịghị iju anyị anya na e nwere ihe ụfọdụ mmadụ na-agaghị aghọtacha gbasara Jehova.
Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isiri anyị ike ịghọta na Chineke enweghị mmalite, o nweghị ọgwụgwụ, anyị ga-ahụ na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ma anyị chebara ya echiche. Ọ bụrụ na e nwere onye kere Chineke, ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ onye ahụ kere ihe niile. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova “kere ihe niile.” (Mkpughe 4:11) Ihe ọzọkwa bụ na anyị ma na e nwere mgbe eluigwe na ụwa na-adịghị. (Jenesis 1:1, 2) Oleezi otú eluigwe na ụwa si bido ịdị? Onye kere ha ga-ebugodị ụzọ dị adị tupu ya ekewe ha. Chineke adịla adị tupu ihe niile nwere ọgụgụ isi adịrị, dị ka Ọkpara ọ mụrụ naanị ya na ndị mmụọ ozi. (Job 38:4, 7; Ndị Kọlọsi 1:15) O doro anya na e nwere mgbe ọ bụ naanị Chineke nọ. E nweghịkwa otú a ga-esi eke Chineke n’ihi na e nweghị onye ma ọ bụ ihe dị adị ga-ekeli ya.
Ndụ anyị dị na ihe dị iche iche dị n’eluigwe nakwa n’ụwa na-egosi na Chineke, onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, dị adị. N’eziokwu, Onye mere ka ụwa anyị a na ihe ndị dị n’eluigwe na-aga otú ha kwesịrị ịga, meekwa ka e nwee iwu na-achị ha, enweghị mmalite. Ọ bụ naanị ya bụ onye nwere ike ime ka ihe ọ bụla ọzọ dịrị.—Job 33:4.