Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA

Ị̀ Na-eme Ihe Chineke Chọrọ Ka I Mee?

Ị̀ Na-eme Ihe Chineke Chọrọ Ka I Mee?

Ọ bụrụ na ị hụ onye na-abụghị enyi gị ma ọ bụ onye ị na-amaghị onye ọ bụ, ị̀ ga-agwa ya, sị: “Ihe ọ bụla ị chọrọ ka m meere gị, gwa m ya, m ga-emere gị ya”? Mbanụ! Ma, i nwere ike ịgwa ya ezigbo enyi gị. N’eziokwu, ezigbo enyi na-achọ imere enyi ya ihe ọ chọrọ ka o meere ya.

Baịbụl gosiri na ọtụtụ mgbe, Jehova na-emere ndị na-efe ya ihe ga-eme ka obi dị ha ụtọ. Dị ka ihe atụ, otu ezigbo enyi Chineke aha ya bụ Devid kwuru, sị: “I mewo ọtụtụ ihe, Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị. . . . Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.” (Abụ Ọma 40:5) Jehova na-emekwara ndị na-anaghị efe ya ihe ọma, ‘na-enye ha nri n’ụba, na-emekwa ka ha nwee obi ụtọ.’—Ọrụ Ndịozi 14:17.

Obi na-atọ anyị ụtọ imere ndị anyị hụrụ n’anya ihe ọma

Ebe ọ bụ na ọ na-amasị Jehova imere ndị mmadụ ihe ga-eme ka obi dị ha ụtọ, ihe ọ pụtara bụ na yanwa chọkwara ka ndị chọrọ ịbụ enyi ya na-eme ihe ga-eme ka ‘obi ya ṅụrịa.’ (Ilu 27:11) Ma, olee ihe ị ga na-eme ka obi dị Chineke mma? Baịbụl gwara anyị, sị: “Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 13:16) Ma, ọ̀ pụtara na ọ bụ naanị ime ihe ọma na inye ndị mmadụ ihe ka anyị ga na-eme ka obi dị Jehova mma?

Baịbụl sịrị: ‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụ mgbe ‘Ebreham gosichara na ya nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ’ ka a kpọrọ ya “enyi Jehova.” (Jems 2:23) Jizọs mekwara ka o doo anya na anyị ‘ga-enwerịrị okwukwe n’ebe Chineke nọ’ ma anyị chọọ ka Chineke gọzie anyị. (Jọn 14:1) Ma, olee otú ị ga-esi nwee okwukwe a Chineke chọrọ ka ndị ga-abụ enyi ya nwee? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịna-amụ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, mgbe niile. Ịmụ Baịbụl ga-eme ka ị mụta ‘uche Chineke’ nke ọma, mụtakwa otú ị ga-esi “na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.” Ọ bụrụ na ị na-amụtakwu banyere Jehova ma na-eme ihe ọma ndị ọ chọrọ ka ị na-eme, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike, gị na ya ga-adịkwu ná mma.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.