Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Na Baịbụl, gịnị ka okwu bụ́ “ọnaozi” pụtara?

Onye ọnaozi ndị Asiria kpụrụ n’ahụ́ ájá

Mgbe ụfọdụ, a kpọọ mmadụ ọnaozi, ọ pụtara na onye ahụ bụ nwoke a pịrị amụ. N’oge a na-ede Baịbụl, a na-apị ụfọdụ ụmụ nwoke amụ. Ọ na-abụkarị ndị a chọrọ ịta ahụhụ, ndị e jidere n’agha, ma ọ bụkwanụ ndị e ji mere ohu ka a na-apị amụ. Ọ bụ ụmụ nwoke a pịrị amụ, bụ́ ndị a tụkwasịrị obi, na-elekọta ebe ụmụ nwaanyị na-ebi n’obí eze. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị ọnaozi abụọ aha ha bụ Hegaị na Sheashgaz na-elekọta ndị nwunye eze Peshia aha ya bụ Ahazuirọs na ndị iko ya. Ọ dị ka ọ̀ bụ eze a bụ Zaksis nke Mbụ.—Esta 2:3, 14.

Ma, ọ bụghị ndị niile Baịbụl kpọrọ ndị ọnaozi ka a pịrị amụ. Ndị ọkà mmụta kwuru na a na-akpọkwa onye na-arụ ọrụ n’obí eze ọnaozi. Ọ ga-abụ na ihe mere e ji kpọọ Ibed-melek, bụ́ onye ya na Jeremaya rụkọrọ ọrụ, ọnaozi bụ na ọ na-arụ ọrụ n’obí eze. Ọ ga-abụkwa ya mere e ji kpọọ otu nwoke Itiopia Filip ziri ozi ọma ọnaozi. O nwere ike ịbụ na Ibed-melek nọ n’ọkwá dị elu n’obí Eze Zedekaya n’ihi na ọ chọọ ịhụ eze a, ọ na-aga n’onwe ya ahụ ya. (Jeremaya 38:7, 8) Baịbụl kwukwara na nwoke Itiopia ahụ na-elekọta akụ̀ eze nwaanyị ndị Itiopia nakwa na “ọ gara Jeruselem ife Chineke.”—Ọrụ Ndịozi 8:27.

Gịnị mere ndị na-azụ atụrụ n’oge Baịbụl ji ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ?

Mgbe Jizọs na-ekwu ihe ga-eme n’oge a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’ọdịnihu, ọ sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, . . . ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.” (Matiu 25:31, 32) Gịnị mere onye na-azụ ewu na atụrụ ga-eji ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ?

Ndị na-azụ ewu na atụrụ na-eduru ewu na atụrụ ha aga ebe ha ga-anọ taa ahịhịa. N’abalị, ha na-akpọba ha n’ụlọ a rụụrụ ha ka anụ ọhịa ghara ịtagbu ha, ka ndị ohi ghara izuru ha, ma ọ bụ ka oyi ghara ịtụgbu ha. (Jenesis 30:32, 33; 31:38-40) A na-edewe atụrụ iche n’ihi na ọ bụghị anụ siri ike, karịchaa, nne atụrụ na ndị nke a mụrụ ọhụrụ, ka ewu ghara imerụ ha ahụ́ n’ihi na ewu na-adị gara gara karịa atụrụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ All Things in the Bible kwuru na ndị na-azụ atụrụ anaghị ekwe ka ewu na atụrụ nọkọta mgbe atụrụ ‘dị ime ma ọ bụ mgbe ọ na-akwado ịmụ nwa, mgbe a na-apịpụta mmiri ara ya, nakwa mgbe a na-akpacha ya ajị.’ Nke a gosiri na ndị Jizọs gwara okwu n’Izrel oge ochie mgbe o ji ewu na atụrụ mee ihe atụ a ghọtara ihe o kwuru n’ihi na ewu na atụrụ juru eju n’ebe ahụ.