Ị̀ Maara?
Olee otú e si eji nkume igwe nri egwe ihe n’oge ochie?
N’oge ochie, a na-eji nkume igwe nri egweri ọka ka ọ bụrụ ntụ ọka e ji eme achịcha. N’ọtụtụ ezinụlọ, ụmụ nwaanyị ma ọ bụ ndị ohu na-eji nkume igwe nri egwe ihe n’ụbọchị ọ bụla. A na-anụkarị ụda ebe a na-egwe ihe n’ụlọ ndị mmadụ n’ụbọchị ọ bụla n’oge ochie.—Ọpụpụ 11:5; Jeremaya 25:10.
E nwere ihe ndị e sere ese na ihe ndị a kpụrụ akpụ gosiri otú e si eji nkume igwe nri egwe ihe n’oge ochie. E si n’Ijipt oge ochie nweta ha. Nkume igwe nri na-enwe ebe gbalitetụrụ elu, elu ya na-adịkwa larịị. A na-etinyezi ọka na ya na-egweri ya. Onye na-egwe nri na-esekpuru n’ihu nkume igwe nri, jiri aka nkume na-egwe ihe n’elu ya, ya gwere gaa ihu, ya egwere gaa azụ. Otu akwụkwọ kwuru na aka nkume e ji egwe ihe na-adịkarị n’agbata kilogram abụọ na kilogram anọ n’ịdị arọ. E jiri ya tụọ mmadụ, o nwere ike igbu onye ahụ.—Ndị Ikpe 9:50-54.
N’oge ochie, igwe nri dị ezinụlọ ọ bụla oké mkpa iji dị ndụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji nye iwu ka mmadụ ghara iburu nkume igwe nri dị ka ihe ibé. Na Diuterọnọmi 24:6, Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ga-eburu nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume igwe nri dị ka ihe ibé, n’ihi na ọ bụ mkpụrụ obi ka ọ na-eburu dị ka ihe ibé.”
Gịnị ka ‘ịnọ n’obi mmadụ’ pụtara?
Baịbụl kwuru na Jizọs “nọ n’obi Nna ya.” (Jọn 1:
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-abụ ndị Juu chọọ iri nri, ha anọrọ n’obere ihe ndina ndị dị gburugburu tebụl ha ga-anọ eri nri. Onye ọ bụla n’ime ha na-anọ ka ò dina edina, chee ihu ya ebe tebụl dị, gbatịa ụkwụ ya n’elu ihe ndina ahụ ma tụkwasị aka ekpe ya n’elu pilo. Otú a ha si anọ na-eme ka ha nwee ike iji aka nri ha na-eri nri. Otu akwụkwọ kwuru na ebe ọ bụ na ndị niile na-eri nri na tebụl na-eji aka ekpe ha atụkwasị n’elu pilo, otu onye nọrọ, ibe ya anọrọ ya n’ihu, “isi onye nọ n’ihu na-anọ nso n’obi onye nọ ya n’azụ. Ọ bụ ya mere e ji ekwu na onye ahụ ‘nọ n’obi’ onye nke ọzọ.”
A na-ewere na a kwanyeere mmadụ ùgwù pụrụ iche ma ọ bụrụ na onye ahụ nọ n’obi onye isi ezinụlọ ma ọ bụkwanụ n’obi onye kpọrọ oriri n’oge a na-eri nri. Ọ bụ ya mere na mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eme Ememme Ngabiga ikpeazụ ha mere, ọ bụ Jọn onyeozi, onye ‘Jizọs hụrụ n’anya,’ nọ nso n’obi Jizọs na-eri nri. Ọ bụkwa ya mere o ji dịrị Jọn mfe ‘ịdala azụ dabere n’obi Jizọs’ ma jụọ ya ajụjụ.