Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ama M Ugbu A na M Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka

Ama M Ugbu A na M Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1981

  • ABỤ M ONYE: GỤATEMALA

  • NDỤ M BIRI: ỌTỤTỤ NSOGBU BỊAARA M MGBE M BỤ NWATA

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Akụl dị́ na Gụatemala. Obodo a dịpụrụ adịpụ, dịrịkwa n’ugwu. Ezinụlọ anyị bụ ndị agbụrụ Izụl bụ́ ndị Maya. M na-asụ asụsụ anyị bụ́ Izụl, na-asụkwa Spanish. N’oge a mụrụ m, a na-alụ agha na Gụatemala. A lụọla agha a afọ iri abụọ tupu a mụọ m. Mgbe a mụchara m, a lụgidekwara ya ruo afọ iri na isii. Ọtụtụ ndị Izụl nwụrụ n’oge a na-alụ agha a.

Mgbe m dị afọ anọ, nwanne m nwoke dị́ afọ asaa ji obere bọmbụ a na-eji aka atụ na-egwu egwu, ya agbawaa. Bọmbụ ahụ tkpọrọ m anya ma gbuo nwanne m ahụ. A kpọgara m n’ụlọ akwụkwọ a na-elekọta ụmụaka kpuru ìsì n’isi obodo Gụatemala. Ebe ahụ ka m nọ mụta otú e si agụ ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Ndị na-arụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ anaghị ekwe ka mụ na ụmụaka ndị ọzọ kpuru ìsì na-ekwurịta okwu. Ụmụ akwụkwọ ibe m anaghịkwa akpa m nso. Aghọtachaghị m ihe mere ha ji na-eme m otú a. Owu na-amakarị m. Ọ na-agụsi m agụụ ike ka oge anyị ji aga ezumike ọnwa abụọ n’afọ ruwe eruwe ka m gaa hụ mama m n’ihi na ọ na-eji nwayọọ emeso m ihe, na-egosikwa m obiọma. Ma, ọ nwụrụ mgbe m dị afọ iri. Ọnwụ ya gbawara m obi n’ihi na ọ bụ naanị ya ka m ma hụrụ m n’anya.

Mgbe m dị afọ iri na otu, m laghachiri n’obodo anyị, soro nwanne m nwoke na ezinụlọ ya biri. Ha na-akpa afọ m, ma, o nweghị onye n’ime ha chọrọ ịma otú obi na-adị m. Mgbe ụfọdụ, m na-ajụ Chineke, sị: “Gịnị mere mama m ji nwụọ? Gịnị mere i ji kwe ka m kpuo ìsì?” Ndị mmadụ gwara m na ihe ndị a mere m bụ otú Chineke si chọọ ya. M weere ya na obi fere Chineke azụ nakwa na ọ naghị eche banyere m. Naanị ihe mere egbughị m onwe m bụ na o nweghị ihe m hụrụ m ga-eji gbuo onwe m.

Ndị mmadụ na-eme m ihe masịrị ha n’ihi na m kpuru ìsì. Mgbe m dị obere, e dinara m n’ike ugboro ugboro. O nweghị onye m kọọrọ ihe ndị a ndị mmadụ mere m n’ihi na echeghị m na o nwere onye chọrọ ịma banyere m. Ọ na-esi ike ndị mmadụ ekwunyere m okwu, o nweghịkwa onye m na-ekwunyere okwu. M na-anọrọ onwe m, obi ana-ajọ m njọ, o nweghịkwa onye m tụkwasịrị obi.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Mgbe m dị afọ iri na atọ, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova bịakwutere m mgbe anyị pụrụ brek n’ụlọ akwụkwọ anyị. Otu onye nkụzi anyị ọnọdụ m na-ewute gwara ha ka ha bịa hụ m. Ha si na Baịbụl gwa m na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa na otu ụbọchị ndị kpuru ìsì ga-ahụ ụzọ ọzọ. (Aịzaya 35:5; Jọn 5:28, 29) Ihe a ha kụziiri m tọrọ m ụtọ, ma ebe ọ na-esi ike mụ na mmadụ akpaa nkata, o siiri m ike iso ha kwurịta okwu. Ma, n’agbanyeghị na-anaghị m azaghachicha ha okwu, ha nweere m ndidi na-abịa akụziri m Baịbụl. Di na nwunye a na-eji ụkwụ gaa ihe karịrị kilomita iri, rịakwa ugwu tupu ha erute n’obodo anyị.

Nwanne m nwoke gwara m na di na nwunye ahụ enweghị ego, mana ha na-adị mma n’anya. N’agbanyeghị na ha enweghị ego, ha na-echebara m echiche, na-enyekwa m obere onyinye. Echere m na ọ bụ naanị ezigbo Ndị Kraịst ga-ewepụtali onwe ha otú a na-enyere mmadụ aka.

E ji akwụkwọ ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dee kụziere m Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na m na-aghọta ihe a na-akụziri m, ma ọ na-esiri m ike ikweta ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, o siiri m ike tupu mụ ekweta na Chineke na ndị mmadụ na-eche banyere m. Aghọtara m ihe mere Chineke ji hapụtụgodị ka ihe ọjọọ na-eme, ma, o siiri m ike iwere ya ka ezigbo Nna hụrụ m n’anya. *

Nwayọọ nwayọọ ihe ndị m na-amụta na Baịbụl mere ka m gbanwee echiche m. Dị ka ihe atụ, amụtara m na ihe gbasara ndị na-ata ahụhụ na-emetụ Chineke n’obi. N’otu oge a na-emegbu ndị Chineke, o kwuru, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m . . . m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” (Ọpụpụ 3:7) Mgbe m ghọtara na Jehova na-eche banyere m, m nyefere ya onwe m. N’afọ 1998, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

Mụ na nwanna ahụ m bi na nke ha

Mgbe ihe dị ka otu afọ gara m mechara baptizim, agara m ebe a nọ kụziere mụ na ndị ìsì ibe m ihe ụfọdụ. Ebe ahụ dị nso n’obodo Eskuintila. Otu okenye nọ́ n’ọgbakọ dị́ ebe ahụ chọpụtara na ọ na-anaghị adịchara m mfe isi n’ụlọ anyị na-aga ọmụmụ ihe. Ọgbakọ kacha dịrị mụ nso dị n’ebe di na nwunye ahụ na-abịa akụziri m Baịbụl na-esi abịa. Ọ pụtara na mgbe ọ bụla m ga-aga ọmụmụ ihe, m na-arị ugwu ahụ ha na-arị abịa na nke m, ọ naghịkwa adịrị m mfe. Okenye a rịọrọ otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova bí n’Eskuintla ka mụ na ha biri nakwa ka ha nyere m aka ịna-aga ọmụmụ ihe, ha ekweta, mụ akwafetazie na nke ha. Mụ na ha bikwa ruo taa. Ha na-elekọtakwa m ka m̀ bụ nwa ha ma ọ bụ nwanne ha.

Ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ egosikwala m na ha hụrụ m n’anya n’eziokwu. Ihe ndị a niile emeela ka m kwetasie ike na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst.—Jọn 13:34, 35.

URU NDỊ M RITERELA:

Anaghị m ewerezi onwe m ka onye na-abaghị uru ma ọ bụkwanụ onye na-enweghị olileanya. Ndụ m enweela isi. M na-ekwusa ozi ọma oge niile ugbu a. M na-eso Ndịàmà Jehova ibe m akụziri ndị mmadụ Baịbụl kama ịna-echegbu onwe m maka na m kpuru ìsì. Abụkwa m okenye n’ọgbakọ. M na-eji Baịbụl agwa ọhaneze okwu n’ọgbakọ. E nweekwala mgbe m ji Baịbụl gwa ìgwè mmadụ okwu ná mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova.

Ebe m ji Baịbụl ndị ìsì na-agwa ọgbakọ okwu

N’afọ 2010, m gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi (nke a na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze) e nwere na El Salvadọ. Ihe ndị m mụtara n’ụlọ akwụkwọ a mere ka m nwee ike ịna-arụkwu ọrụ ndị m na-arụ n’ọgbakọ nke ọma. Ọzụzụ a e nyere m gosiri m na Jehova Chineke ji m kpọrọ ihe nakwa na ọ hụrụ m n’anya. Obi dị m ụtọ na ọ gụrụ m n’onye ruru eru ịrụrụ ya ọrụ.

Jizọs kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) M nwere ike ikwu taa na obi dị m ụtọ n’eziokwu. O nweghị mgbe m cheburu na m ga-enyeliri ndị ọzọ aka. Ma, ama m ugbu a na m ga-enyeliri ndị ọzọ aka.

^ para. 13 Ị chọọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji hapụ ka ihe ọjọọ dịrị, gụọ isi nke 11 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.