ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?
Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?
Olee ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ? Legodị ihe ise nyerela ụfọdụ ndị aka.
Nọrọ n’ebe ahụ́ ga-eru gị ala. Gbalịa nọrọ ebe dị jụụ. Gbaa mbọ ka a ghara inwe ihe ga na-adọpụ gị uche. Ịnọ ebe ị ga na-ahụ ihe ị na-agụ nke ọma, nakwa ebe ezigbo ikuku ga na-ekusa gị ga-eme ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ.
Jiri obi ọcha gụọ ya. Ebe ọ bụ Nna anyị bi n’eluigwe nwe Baịbụl, ọ ga-abara gị uru ma i mee ka nwatakịrị chọrọ ịmụta ihe n’aka nne ma ọ bụ nna ya hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma ị na-eche gbasara Baịbụl, ọ ga-adị mma ka ị hapụ ya ka Chineke nwee ike ịkụziri gị ihe.—Abụ Ọma 25:4.
Kpee ekpere tupu gị agụwa Baịbụl. Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịrịọ ya ka o nyere anyị aka ịghọta ya. Chineke kwuru na ọ ga-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” (Luk 11:13) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ịghọta uche Chineke. Nwayọọ nwayọọ, ọ ga-emekwa ka ị ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 2:10.
Gụọ ya otú ị ga-aghọta ya. Agụla ya naanị ka ị gụchaa isi ole i kpebiri ịgụ otu mgbe. Chebara ihe ị na-agụ echiche. I nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee àgwà ọma onye a na-ekwu gbasara ya ebe a nwere? Olee otú m ga-esi na-eme ka ya?’
Nwee ihe i bu n’obi Baịbụl ị na-achọ ịgụ ga-enyere gị aka na ya. Ị chọọ ka Baịbụl ị na-achọ ịgụ na-atọ gị ụtọ, i kwesịrị ibu n’obi na ị ga-amụta ihe ga-abara gị ezigbo uru. I nwere ike ibu n’obi ịmụtakwu gbasara Chineke, ma ọ bụkwanụ otú ị ga-esi bụrụ ezigbo mmadụ, ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye. Gazie ebe Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka ime ihe ndị a ị chọrọ ime, gụwa ha. *
Ime ihe ise a ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ. Ma, olee otú ị ga-esi eme ka ọ na-atọkwu gị ụtọ? Isiokwu na-eso nke a ga-akọrọ gị ihe ụfọdụ ị ga-eme.
^ para. 8 Ọ bụrụ na ị maghị ebe e kwuru ihe ndị ahụ na Baịbụl, i nwere ike ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka.