Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
È nwere mgbe a ga-enwe ikpe ziri ezi n’ụwa?
Gịnị ka ị ga-aza?
Ee
Mba
O nwere ike
Ihe Baịbụl kwuru
“Amaara m nke ọma na Jehova ga-eme ka onye nọ n’ahụhụ nweta ihe ruuru ya, ka ndị ogbenye nweta ikpe ziri ezi.” (Abụ Ọma 140:12) Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Chineke na-ahụ mmegbu a na-emegbu ndị mmadụ n’ụwa a, ọ ga-akwụsịkwa ya.—Ekliziastis 5:8.
Mgbe Chineke ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa, udo ga-adị ebe niile, obi eruokwa ndị mmadụ ala.—Aịzaya 32:16-18.
È nwere mba Chineke hụrụ n’anya karịa ibe ya?
Ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke bụrụ mba ụfọdụ ọnụ, gọziekwanụ ụfọdụ, ndị ọzọ ana-ekwu na Chineke hụrụ mba niile n’anya. Gịnị ka i chere?
Ihe Baịbụl kwuru
“Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) N’anya Chineke, mmadụ niile hà otu.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Baịbụl nwere “ozi ọma” maka “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile.”—Mkpughe 14:6.