Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ịgba Karat Na-atọ M Ụtọ”

“Ịgba Karat Na-atọ M Ụtọ”
  • A Mụrụ M n’Afọ: 1962

  • Abụ M Onye: Amerịka

  • Ndụ M Biri: Etinyere m obi m niile n’ịgba karat

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 Emerụrụ m onye mụ na ya na-amụgharị ịgba karat ezigbo ahụ́. M gbatara ya ụkwụ n’imi n’amaghị ama. Obi m mawara m ikpe, mụ ana-ajụ onwe m ma m̀ ka kwesịrị ịnọgide na-agba karat. Ma, gịnị mere ihe a ji mee ka m chewe ma m̀ ka kwesịrị ịna-eme egwuregwu a na-atọ m ụtọ kemgbe ọtụtụ afọ? Ka m burugodị ụzọ kọọ otú m si malite ịgba karat.

 Etoro m n’ebe dị nso n’obodo Bufalo dị na Niu Yọk, n’Amerịka. Ezinụlọ anyị na-ekpesi Katọlik ike, anyị na-ebikwa n’udo. Agara m ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik, na-ejekwara ụkọchukwu ozi n’ọlta. Ndị mụrụ m chọrọ ka ihe gaziere mụ na nwanne m nwaanyị. N’ihi ya, ha kwetara ka m soro na-eme egwuregwu ụfọdụ a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ ma ọ bụ na-arụtụ ọrụ m ga-eji na-enweta ego ma ọ bụrụhaala na m ka ga na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ihe a mere ka m bido na nwata na-eji ihe m na-eme akpọrọ ihe.

 Mgbe m dị afọ iri na asaa, amalitere m ịmụ otú e si agba karat. Ruo ọtụtụ afọ, m na-eji awa atọ n’ụbọchị amụgharị otú e si agba karat. M na-emekwa ya abalị isii n’izu ọ bụla. N’izu ọ bụla, m na-eji ọtụtụ awa eche banyere ụzọ dị iche iche m mụtarala e si agba karat, na-elekwa vidio ndị ga-enyere m aka ịna-emekwu nke ọma. Ọ na-atọ m ụtọ ikechi anya na-amụgharị ịgba karat, ma mgbe m ji ngwá ọgụ na-eme ya. M nwere ike iji aka kụọ bọọdụ ma ọ bụ brik otu ugbo, kụwaa ya. Eso m ná ndị kacha mee nke ọma n’ọtụtụ asọmpi ndị m so mee, nwetakwa ọtụtụ ihe nrite. Ịgba karat ghọrọ ihe kacha m mkpa ná ndụ.

 Echere m na ihe agazierela m ná ndụ. Emere m nke ọma n’ụlọ akwụkwọ mahadum, nwetakwa ezigbo akara ugo mmụta. Arụrụ m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ a ma ama. Ọrụ m n’ebe ahụ bụ ịhụ maka kọmputa. E wezụga ụgwọ ọnwa m, ụlọ ọrụ ahụ nyekwara m ọtụtụ onyinye ndị ọzọ. Enwere m ụlọ nke aka m, nweekwa enyi nwaanyị. Mmadụ na-ele m, ọ ga-asị na ihe niile zuuru m. Ma, e nwere ọtụtụ ajụjụ ndị nọ na-echu m ụra.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Amalitere m ịga chọọchị ugboro abụọ n’izu iji mata azịza ajụjụ ndị ahụ, na-arịọkwa Chineke ka o nyere m aka. Ma, ihe otu enyi m gwara m otu ụbọchị gbanwere ndụ m. Ajụrụ m ya, sị: “Ì chetụla banyere ihe mere e ji kee anyị? Nsogbu na ikpe na-ezighị ezi jukwara ebe niile.” Ọ gwara m na ya ajụọkwala ụdị ajụjụ ahụ nakwa na ya hụrụ azịza ya na Baịbụl. O nyere m otu akwụkwọ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. a Ọ gwara m na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Na mbụ, enwebughị m mmasị ịgụ akwụkwọ ahụ n’ihi na echere m na ekwesịghị m ịgụ akwụkwọ ndị chọọchị ọzọ. Ma, ebe ọ bụ na m chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị ahụ na-echụ m ụra, m sịrị ka m gụọ ya lee ma ihe Ndịàmà Jeohva na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu.

 Mgbe m chọpụtara ihe Baịbụl na-akụzi, ọ tụrụ m n’anya. Amụtara m na ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ bụ ka ha dị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa a, nakwa na ihe a Chineke bu n’obi agbanwebeghị. (Jenesis 1:28) Ọ tụrụ m n’anya ịhụ aha Chineke, bụ́ Jehova, na Baịbụl King James m. Amụtakwara m na ọ bụ aha a ka m na-ekpe ekpere banyere ya ma m kpewe Ekpere Onyenwe Anyị. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 6:9) Emechakwara m ghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ugbu a. Ihe niile m mụtara dabara nnọọ adaba, bụrụkwa eziokwu. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ.

 Agaghị m echefu otú obi dị m mgbe m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Onye ọ bụla nọ na-amụmụrụ m ọnụ ọchị, chọọkwa ịmata aha m. N’ọmụmụ ihe mbụ m gara, e ji Baịbụl kwuo okwu pụrụ iche banyere ekpere ndị Chineke na-anụ. Okwu ahụ e kwuru masịrị m n’ihi na m na-ekpe ekpere kemgbe ka Chineke nyere m aka. M gakwara Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’oge ndị a, ọ tụrụ m n’anya ịhụ ka ụmụaka sokwa na-asapeta Baịbụl ma na-ele anya na nke ha mgbe a na-agụ ya. Ná mmalite, amaghị m otú e si achọta amaokwu Baịbụl. Ma, Ndịàmà Jehova nyeere m ezigbo aka, kụziere m otú m ga-esi na-achọta ya.

 Ka m nọ na-agakwu ọmụmụ ihe, m bịara nwekwuo mmasị n’ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi n’ihi na ozizi ha bụ ịgba. M na-amụta ezigbo ihe n’ọmụmụ ihe ọ bụla, ha na-agbakwa m ume. A gwaziri m ka a mụwara m Baịbụl.

 Ihe m hụrụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ dị ezigbo iche n’ihe m na-ahụ na chọọchị anyị. M chọpụtara na Ndịàmà Jehova dị n’otu, na-ekwukwa eziokwu. Ha na-agbalị ike ha ime ihe na-amasị Chineke. Ka oge na-aga, ọ bịara doo m anya na ha hụrụ ibe ha n’anya, nke bụ́ ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst.​—Jọn 13:35.

 Ka m na-amụkwu Baịbụl, ka m na-agbanwekwu ndụ m ka ọ na-adaba n’ihe Baịbụl na-akụzi. Ma, ọ dị m ka agaghị m akwụsịli ịgba karat. Ịmụgharị otú e si agba karat na ịga asọmpi na-atọgbu m atọgbu. Mgbe m gwara onye na-amụrụ m Baịbụl banyere ya, o mesiri m obi ike. Ọ gwara m, sị: “Nọgide na-amụ Baịbụl. Ama m na ị ga-eme mkpebi dị mma.” Ihe a ọ gwara m gbara m ezigbo ume. Ka m nọ na-amụkwu Baịbụl, ọ bịara na-agụkwu m agụụ ime ihe na-amasị Jehova Chineke.

 Amalitere m ịgbanwe ndụ m mgbe ihe ahụ m kọrọ ná mmalite mechara, ya bụ, mgbe ahụ m gbatara onye mụ na ya na-amụgharị ịgba karat ụkwụ n’imi n’amaghị ama. Ihe a mere ka m jụọ onwe m ma m̀ ga-abụli onye na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo ma m nọgide na-agba karat. Amụtara m n’Aịzaya 2:​3, 4 na e buru amụma na ndị na-edebe iwu Jehova agaghịkwa “amụ otú e si alụ agha.” Jizọs kụzikwaara ndị ọzọ ka ha ghara ịlụ ọgụ, ọ bụrụgodị na a na-emegbu ha. (Matiu 26:52) N’ihi ya, m kwụsịrị ime egwuregwu ahụ na-atọgbu m atọgbu.

 Amaliteziri m ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́, “na-azụ onwe gị ka ị bụrụ onye na-efe Chineke.” (1 Timoti 4:7) M na-ejizi oge na ike m jibu agba karat na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Enyi m nwaanyị ekweghị n’ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. N’ihi ya, mụ na ya kwụsịrị ịkpa. Emere m baptizim n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1987 ma bụrụzie Onyeàmà Jehova. Mgbe obere oge gachara, amalitere m iji oge m niile na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Kemgbe ahụ, m ka na-eje ozi oge niile. O nwekwara mgbe m jere ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Niu Yọk, n’Amerịka.

URU NDỊ M RITERELA

 Ugbu a m matarala eziokwu banyere Chineke, achọtala m ihe m na-achọ ná ndụ. Ọ naghịzi adị m ka ndụ m enweghị isi. Kama, ndụ m enweela isi. Enweela m olileanya maka ọdịnihu. M na-enwekwa ezigbo obi ụtọ. M ka na-emega ahụ́, ma ọ bụghị ịzụ ahụ́ m bụ ihe kacha m mkpa ná ndụ. Ihe kacha m mkpa bụzi ijere Jehova Chineke ozi.

 Mgbe m na-agba karat, m na-eleru anya ma mụ na ndị mmadụ nọrọ. Ihe m na-echekarị bụ otú m ga-esi echebe onwe m ma e nwee onye chọrọ ịlụso m ọgụ. Taa, m ka na-elerukwa anya ma mụ na ndị mmadụ nọrọ. Mana ihe m bu n’obi eme ya dịzi iche. Ọ bụ iji nyere ha aka. Baịbụl enyerela m aka ịmụta ịna-emesapụ aka, na ịbụrụ nwunye ọma m bụ́ Brenda ezigbo di.

 Ịgba karat na-atọbu m ezigbo ụtọ. Ma, ejirila m ihe ka ya mma dochie ya. Ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mmadụ ịzụ ahụ́ ya bara obere uru. Ma, ife Chineke otú ọ chọrọ bara uru n’ihe niile, n’ihi na ọ bara uru ná ndụ anyị dị ugbu a. Ọ ga-abakwara anyị uru ná ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu.”​—1 Timoti 4:8.

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ma a naghịzi ebipụta ya.