Ndịàmà Jehova Hà Kweere n’Agba Ochie?
Ee. Ndịàmà Jehova kweere na Akwụkwọ Nsọ dum ‘si n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.’ (2 Timoti 3:16) Ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ socha n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, ihe Ndịàmà Jehova na-akpọkarị ha bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe mere ha ji akpọ ha aha ndị a bụ ka ọ ghara ịdị ka è nwere nke merela ochie ma ọ bụ nke na-adịghịzi mkpa.
Gịnị mere Agba Ochie na Agba Ọhụrụ ji dị Ndị Kraịst mkpa?
Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka.” (Ndị Rom 15:4) N’ihi ya, e nwere ihe ndị ga-abara anyị uru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma é nweghị ihe ọzọ, akụkọ ndị a kọrọ na ya na ndụmọdụ ndị dị na ya ga-abara anyị uru.
Akụkọ ndị dị ezigbo mkpa. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kọrọ gbasara otú Chineke si kee ihe na otú Adam na Iv si mehie Chineke. A sị na Baịbụl emeghị ka anyị mara ihe ndị a, anyị agaraghị ama otú mmadụ si bido dịwa na ihe mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ? (Jenesis 2:7, 17) Ihe ọzọkwa bụ na Akwụkwọ Hibru kọọrọ anyị otú Jehova Chineke si mesoo ndị mmadụ ibe anyị ihe, bụ́ ndị ihe na-eme anyị obi ụtọ mere obi ụtọ na ndị nwere ụdị nsogbu anyị na-enwe.—Jems 5:17.
Ndụmọdụ bara uru. Akwụkwọ Ilu na akwụkwọ Ekliziastis, ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nwere okwu amamihe ndị oge ha na-anaghị agafe agafe. Ha gwara anyị ihe anyị ga-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị (Ilu 15:17), otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ (Ilu 10:4; Ekliziastis 4:6), na ihe kacha mma ndị na-eto eto ga-eji oge ntorobịa ha mee (Ekliziastis 11:9–12:1).
Anyị ga-eritekwa ezigbo uru ma anyị mụọ ihe ndị dị n’Iwu Mozis. Ha dị na Tora (ya bụ, akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl). Ọ bụ eziokwu na Iwu ahụ abụghị maka Ndị Kraịst, ma e nwere ezigbo ihe ndị dị na ya ga-eme ka ndụ anyị kakwuo mma.—Levitikọs 19:18; Diuterọnọmi 6:5-7.